Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 16:18 - Bible Nso

18 Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n'okwu, buru kwa nwoke mara nma n'aru, Jehova nọye-kwa-ra ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Otu onye nʼime ndị na-eje ozi kwuru sị, “Lee, ahụla m otu nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, onye Betlehem, onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ bụ dike na ọka nʼagha. Ọ bụ onye na-ekwu okwu nke ọma, na nwoke mara mma ile anya. Onyenwe anyị nọnyekwara ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 16:18
16 Iomraidhean Croise  

Jehova we nọyere Josef, ọ we buru nwoke ihe nāgara nke-ọma; ọ nọ n'ulo onye-nwe-ya, bú onye Ijipt ahu.


Ọ dighi ihe ọ bula onye-isi ulo-nkpọrọ ahu nāhu nke di n'aka-ya, n'ihi na Jehova nọyere ya; ihe nke ya onwe-ya nēme, Jehova mere ka ọ ga nke-ọma.


ọ bu ichighari iru okwu a ka Joab, bú orù-gi meworo ihe a: ma onye-nwem bu onye mara ihe, dika amam-ihe nke mọ-ozi nke Chineke, ima ihe nile di n'uwa.


Onye ahu kwa, ọbuná onye bu dìnkpà, onye obi-ya di ka obi ọdum, ọ gāb͕aze ab͕aze: n'ihi na Israel nile amawo na dike ka nna-gi bu, ndi bu dìnkpà ka ha bu kwa, bú ndi ya na ha nọ.


Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n'ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali.


Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.


Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


O gēru kwa, mb͕e ihe-iriba-ama ndia biaruru gi aru, gi mere onwe-gi dika aka-gi si chọta; n'ihi na Chineke nọyere gi.


Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n'ihi na nka bu ya.


Sọl we si ndi-orù-ya, Biko, hutaranum nwoke nke nākpọ ubọ nke-ọma, me-kwa-nu ka ọ biakutem.


Sọl we zigara Jesi ndi-ozi, si, Ziterem Devid nwa-gi, nke nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu.


Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl.


Samuel we tó, Jehova nọye-kwa-ra ya, Ọ kweghi kwa ka okwu da n'ala sitere n'okwu-ya nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan