Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 15:3 - Bible Nso

3 Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ugbu a, gaa buso ndị Amalek agha. Gbuchapụ ihe niile ha nwere. Enwekwala ọmịiko nʼahụ ha. Gbuo ndị ikom niile, ndị inyom niile, ụmụntakịrị niile na ụmụ na-aṅụ ara, igwe ehi na atụrụ, ịnyịnya kamel na ịnyịnya ibu ha niile.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 15:3
20 Iomraidhean Croise  

Timna bukwara Elifaz nwa Isọ iko-nwayi; ọ muara Elifaz Amalek: ndia bu umu-ndikom Eda nwunye Isọ.


Ọ sim, Ònye ka i bu? M'we si ya, Onye Amalek ka m'bu.


Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe.


gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;


Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si, Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu; Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.


Ma ub͕u a b͕uenu nwoke ọ bula n'etiti umu-ntakiri, ọ bu kwa nwayi ọ bula nke mara nwoke site na ndina nwoke ka unu gēb͕u.


o were ya, na eze-ya, na obodo-ya nile; ha were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga madu nile nke di nime ya ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: dika o mere Hebron, otú a ka o mere Debia, me kwa eze-ya; dika ọ me-kwa-ra Libna, me kwa eze-ya.


O we me ihe dìnkpà, tib͕u kwa Amalek, we naputa Israel n'aka ndi nāpunara ha ihe.


Jehova we ziga gi ije ije, si, Je wezuga ndi-nmehie ahu, bú ndi Amalek, ka ebibie ha, i gēbuso kwa ha agha rue mb͕e agēme ka ha gwusia.


Ma Sọl na ndi Israel nwere ọmiko n'aru Egag, na n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu, na nke ìgwè ehi, na nke umu anu mara abuba, na n'aru umu-aturu, na n'aru ihe nile di nma, ha ekweghi kwa iwezuga ha ka ebibie ha: ma anu-ulo ọ bula nke di nlelì nke ta-kwa-ra aru, nke ahu ka ha wezugara ka ebibie ya.


O were kwa ọnu mma-agha tib͕ue Nob, bú obodo ndi-nchu-àjà, were ọnu mma-agha tib͕ue ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, na ehi na inyinya-ibu na aturu.


Devid we tib͕ue ala ahu, o meghi kwa ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ma ọ chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na inyinya-ibu, na camel, na uwe, laghachi, biakute Ekish.


Devid we tib͕ue ha site n'ururuchi we rue anyasi echi-ya: ọ dighi kwa otù nwoke nime ha wepugara onwe-ya, ma-ọbughi nnù umu-okorọbia, ndi nọkwasiri na camel-ha, we b͕alaga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan