Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 15:28 - Bible Nso

28 Samuel we si ya, Jehova adọwapuwo ala-eze Israel n'aru gi ta, nye ya madu-ibe-gi, nke di nma kari gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Mgbe ahụ, Samuel zara sị ya, “Taa Onyenwe anyị adọwapụla alaeze Izrel site nʼaka gị were ya nyefee otu nʼime ndị agbataobi gị, onye ka gị mma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 15:28
20 Iomraidhean Croise  

ime ka ala-eze si n'ulo Sọl gabiga, na ime ka oche-eze Devid guzosie ike n'elu Israel na n'elu Juda, site na Dan we rue na Bia-sheba.


Ma ub͕u a menu ya: n'ihi na Jehova ekwuwo okwu bayere Devid, si, M'gēwere aka Devid, bú orùm, zọputa ndim, bú Israel, n'aka ndi Filistia, na n'aka ndi-iro-ha nile.


Chineke me Abnea otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, ma asi na emereghm Devid ọbuná otú a, bú dika Jehova ṅuworo ya iyi;


Devid we si Maikal, Ọ bu n'iru Jehova, Onye rọputaramn kari nna-gi, kari kwa ulo-ya nile, inyem iwu ibu onye-ndú ndi Jehova, bú Israel: m'we gwú egwu n'iru Jehova.


Jehova we si Solomon, N'ihi na nka di n'aka-gi, i we ghara idebe ọb͕ub͕a-ndum na ukpurum nile, nke M'nyeworo gi n'iwu, aghaghm idọwapu ala-eze n'aru gi, nye orù-gi.


ma ọ jughi Jehova ase: O we me ka ọ nwua, O we chigharia ala-eze nye Devid nwa Jesi.


O nētijisi ndi di ike, ma ngwuputa-ala-ya adighi, Ọ we neguzo ndi ọzọ n'ọnọdu ha.


N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya.


Aganēsi kwa n'ebe madu bi chupu gi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi; ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, oge asa gāgabiga kwa n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ka Ọ nēnye ya.


Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n'elu nye gi ya-ri: n'ihi nka onye raram nye n'aka-gi nwere nmehie kari.


Mb͕e O wepusiri ya, O welie Devid ibu eze-ha; onye Ọ b͕a-kwa-ra àmà, si, Achọtawom Devid nwa Jesi, nwoke nke di ka obim si achọ, onye gēme ihe nile M'nāchọ.


Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.


Ma ub͕u a ala-eze-gi agaghi-eguzosi ike: Jehova achọputaworo Onwe-ya otù nwoke dika obi-Ya si chọ, Jehova enyewo kwa ya iwu ibu onye-ndú ndi-Ya, n'ihi na i debeghi ihe ahu nke Jehova nyere gi n'iwu.


Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n'ihi na nka bu ya.


Iwe Sọl we di ọku nke-uku, okwu a jọ-kwa-ra njọ n'anya-ya; ọ si, Ha enyewo Devid orú nnù na nnù ise, orú nnù na nnù ise, ma ọ bu mu ka ha nyeworo nání nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: ma nke fọduru inye ya bu nání ala-eze.


O gēru kwa, mb͕e Jehova gēmewori nye onye-nwem dika ezi ihe nile si di nke O kwuworo bayere gi, mb͕e Ọ gēnyewo kwa gi-ri iwu ibu onye-ndú Israel;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan