Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 15:13 - Bible Nso

13 Samuel we biakute Sọl: Sọl we si ya, Onye agọziri agọzi n'ebe Jehova nọ ka i bu: emewom ka okwu Jehova guzosie ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Nʼikpeazụ, mgbe Samuel hụrụ ya, Sọl ji oke ọṅụ kelee Samuel sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri agọzi ka ị bụ. Lee, emeela m ihe niile Onyenwe anyị kwuru!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 15:13
17 Iomraidhean Croise  

Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa:


Madu ahu we si, Nwayi ahu nke I nyerem ka mu na ya biri, ya onwe-ya nyerem nkpuru sitere n'osisi ahu, m'we rie.


Devid we zigara ndikom Jebesh-gilead ndi-ozi, si, ha, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, na unu emeworo onye-nwe-unu, bú Sọl, ebere a, unu we líe-ya.


Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi; Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi.


Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.


Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku! Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.


Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara; Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.


Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gēmesi ihe nile akaworo àkà nye unu, sinu, Ayi bu orù ndi nābaghi n'ihe; ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime.


Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a.


Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n'akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu.


_O si, Nwayi agọziri agọzi diri Jehova ka i bu, nwam: i mewo ebere nke-ọma n>ikpe-azu kari na mbu, ebe i n=ejesoghi umu-okorọbia, ma ọ bu onye n=enweghi ike ma-ọbu ọgaranya.


O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku ahu, le, Samuel biara; Sọl we pua izute ya, ka o we gọzie ya.


Echeghariwom na emewom Sọl eze: n'ihi na o siwo n'isom n'azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile.


Sọl we si Samuel, N'ezie egewom nti olu Jehova, we je ije ahu nke Jehova zigaram, m'we me ka Egag eze Amalek bia, ma ewezugaram Amalek ka ebibie ya.


Ma Sọl na ndi Israel nwere ọmiko n'aru Egag, na n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu, na nke ìgwè ehi, na nke umu anu mara abuba, na n'aru umu-aturu, na n'aru ihe nile di nma, ha ekweghi kwa iwezuga ha ka ebibie ha: ma anu-ulo ọ bula nke di nlelì nke ta-kwa-ra aru, nke ahu ka ha wezugara ka ebibie ya.


Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n'ihi na unu enwewo ọmiko n'arum.


Ma otù okorọbia nime umu-okorọbia Nebal gosiri Abigail, bú nwunye Nebal, si, Le, Devid siri n'ọzara zite ndi-ozi igọzi onye-nwe-ayi; o we makwasi ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan