Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 14:52 - Bible Nso

52 Agha we sie ike megide ndi Filistia ubọchi nile nke Sọl: mb͕e Sọl huru nwoke ọ bula bu dike, ma-ọbu nwoke ọ bula bu dìnkpà, o were ya n'onwe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

52 Ndị Izrel na ndị Filistia nọ nʼagha dị egwu ụbọchị niile Sọl bụ eze. Mgbe ọbụla Sọl hụrụ nwoke dị ike, maọbụ dimkpa, ọ na-eduru ya mee ya ka ọ bụrụ otu nʼime ndị agha ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 14:52
4 Iomraidhean Croise  

Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.


Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha.


O rue, mb͕e Samuel ghọrọ agadi, na o doro umu-ya ndikom ndi-ikpe ikpe Israel.


O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya na n'elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n'iru ub͕ọ-ala-ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan