Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 14:40 - Bible Nso

40 O we si Israel nile, Unu onwe-unu nọ n'otù ofè, mu onwem na Jonatan nwam gānọ kwa n'ofè nke-ọzọ. Ndi Israel we si Sọl, Me ihe nke di nma n'anya-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị Izrel niile okwu sị ha, “Guzonụ onwe unu nʼebe ahụ, mụ na nwa m Jonatan ga-eguzo onwe anyị nʼebe a.” Ndị ahụ zara sị, “Mee ihe ọbụla dị gị mma.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 14:40
6 Iomraidhean Croise  

Ndi-orù eze we si eze, Dika ihe nile si di nke onye-nwem, bú eze, garọputa, le, ndi-orù-gi.


Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n'anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara.


Sọl we si, Ka ayi rida sochie ndi Filistia n'azu n'abali, luta ihe-ha n'agha rue ìhè ututu, ka ayi ghara kwa ikwe ka nwoke fọdu n'etiti ha. Ha we si, Me ihe ọ bula nke di nma n'anya-gi. Onye-nchu-àjà we si, Ka ayi biarue Chineke nso n'ebe a.


N'ihi na Jehova nādi ndu, Onye nāzọputa Israel; n'ezie ọ buru na ọ di nime Jonatan nwam, n'ezie ọ ghaghi inwu. Ma ọ dighi onye nāza ya okwu n'etiti ndi Israel nile.


Sọl we si Jehova, bú Chineke Israel, Nye nzà zuru okè. Nzà we ma Jonatan na Sọl: ma ndi Israel puru ya.


Onye nēbu ihe-agha-ya we si ya, Me ihe nile nke di n'obi-gi: chigharia onwe-gi, le, mu onwem nēso gi dika obi-gi si chọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan