Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 14:38 - Bible Nso

38 Sọl we si, Biaruenu nso n'ebe a, unu ndi-isi nile nke ndi Israel: mara-kwa-nu hu ihe nke nmehie a diworo nime ya ta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

38 Sọl gwara ndịisi agha Izrel okwu sị, “Ihe emebiela! Anyị aghaghị ịchọpụta ụdị mmehie anyị mere taa, nke mere Onyenwe anyị ji jụ inye anyị ọsịsa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 14:38
11 Iomraidhean Croise  

Ndi-ya we si, I gaghāpu: n'ihi na ọ buru na ayi ab͕alaga ab͕alaga, ha agaghi-atukwasi ayi obi: ọ buru kwa na nkera nime ayi anwua, ha agaghi-atukwasi ayi obi: n'ihi na ub͕u a orú nnù ndikom na nnù ise dika ayi di; ma ub͕u a ọ di nma ka i buru ayi onye-iye-aka site n'obodo.


Ndi amara aha-ha nke ndi nile di iche iche achikọtawo onwe-ha Ibu ndi Chineke nke Abraham: N'ihi na Chineke nwe ọta nile nke uwa; Emewo ka Ọ di elu nke-uku.


N'aka-Ya ka nkume nkuku gēsi puta, n'aka-Ya ka ǹtú gēsi puta, n'aka-Ya ka uta agha gēsi puta, n'aka-Ya ka onye ọ bula nāchi n'ihe-ike gēsi puta n'otù.


Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,


Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?


ewu-kwa-ra unu dika ulo n'elu ntọ-ala nke bu ndi-ozi na ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus onwe-ya;


Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyere ha n'iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n'ihe-ha.


Umu Israel apughi kwa iguzosi ike n'iru ndi-iro-ha, ha nāb͕akuta azu n'iru ndi-iro-ha, n'ihi na ha aghọwo ihe ewezugara ka ebibie ha: M'gaghi-anọyere unu ọzọ, ma ọ buru na unu ekpochapughi ihe ahu ewezugara nyem n'etiti unu.


Ndi-isi ndi Israel nile, bú ebo nile nke Israel, we guzo onwe-ha nime nkpọkọta ndi Chineke, orú nnù ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndi ji ukwu eje, ndi nāmiputa mma-agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan