Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 14:3 - Bible Nso

3 Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Otu nʼime ndị so Sọl bụ Ahija onye nchụaja, onye yi efọọd. Ọ bụ nwa Ahitub, onye bụ nwanne Ịkabọdụ. Ahitub bụ nwa nwa Finehaz, onye bụ nwa Elayị, onye nchụaja Onyenwe anyị na Shaịlo. Ọ dịkwaghị onye ma na Jonatan apụọla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 14:3
9 Iomraidhean Croise  

Nwoke a we si n'obodo-ya nārigo kwa-arọ ikpọ isi ala na ichuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha àjà n'ime Shailo. Ọ bu kwa n'ebe ahu ka umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, ndi-nchu-àjà Jehova, nọ.


Sọl we si, Ka ayi rida sochie ndi Filistia n'azu n'abali, luta ihe-ha n'agha rue ìhè ututu, ka ayi ghara kwa ikwe ka nwoke fọdu n'etiti ha. Ha we si, Me ihe ọ bula nke di nma n'anya-gi. Onye-nchu-àjà we si, Ka ayi biarue Chineke nso n'ebe a.


Ma Samuel nēje ozi n'iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké.


Èsim n'ebo nile nke Israel rọputa ya iburum onye-nchu-àjà, irigo rue ebe-ichu-àjàm, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, iyiri ephod n'irum? ènye-kwa-ram ulo nna-gi àjà-ọku nile nke umu Israel?


Ma otù nwa-nwoke nke Ahimelek nwa Ahaitub nwere, aha-ya bu Abaiata, wepugara onwe-ya, b͕apu soro Devid.


O we kpọ aha nwa ahu Ikabod, si, Nsọpuru esiwo n'Israel pua: n'ihi owuwe ewere ib͕e Chineke, na n'ihi nna di-ya na di-ya.


Ndi Israel we ziga na Shailo, ha we si n'ebe ahu bute ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n'etiti cherubim: umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nọye-kwa-ra ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan