Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 14:20 - Bible Nso

20 Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n'agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe ahụ, Sọl na ndị niile ya na ha nọ jikọtara onwe ha baa nʼagha ahụ, ma lee, ndị Filistia ji mma agha na-egburita onwe ha. Ọgbaaghara dịkwa nʼebe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 14:20
8 Iomraidhean Croise  

Eze Israel we pua, tib͕ue inyinya na ub͕ọ-ala, o tib͕u-kwa-ra ntib͕u uku n'etiti ndi Siria.


Umu Amon na Moab we guzo imegide ndi bi n'ugwu Sia, iwezuga ha ka ebibie ha na ikpochapu ha: mb͕e ha mere ka ndi bi na Sia gwusia, ha we yere onwe-ha aka, nwoke na ibe-ya, ibibi onwe-ha.


M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze.


M'gākpọ kwa mma-agha ka ọ dakwasi ya n'ugwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): mma-agha onye ọ bula ganēmegide nwa-nne-ya.


Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n'aru ibe-ya, na n'aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n'uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n'akuku Tabat.


Ndi-nche Sọl nwere na Gibea Benjamin we hu; ma, le, ìgwè madu ahu b͕azere, we nēje iru na azu.


Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan