Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 13:2 - Bible Nso

2 Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n'Israel; nnù ndikom ise we di n'aka Sọl nime Mikmash na n'ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n'aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n'etiti ndi Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Sọl sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na Mikmash nʼala ugwu ugwu Betel. Otu puku nọnyeere Jonatan na Gibea, nʼala Benjamin. Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 13:2
24 Iomraidhean Croise  

Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel.


ka enye ayi ndikom asa sitere n'umu-ya, ayi gākwuba kwa ha nye Jehova nime Gibea Sọl, onye Jehova rọputara. Eze we si, Mu onwem gēnye unu ha.


Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin;


Ndikom Mikmas, ọgu isi na abua.


Umu Benjamin bi-kwa-ra site na Geba ga n'iru, nime Mikmash, na Aija, na Bet-el na umu-obodo-ya;


na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.


Joshua we gọzie ha, zilaga ha: ha we jerue ulo-ikwū-ha.


Onye-nwe-ya we si ya, Ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi jerue obodo onye ala ọzọ, ebe onye sitere n'umu Israel nānọghi; kama ayi gāgabiga rue Gibea.


Sọl we la kwa n'ulo-ya rue Gibea; ndi bu dìnkpà, ndi Chineke meturu obi-ha aka, we jeso ya.


Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:


Sọl b͕ara arọ mb͕e ọ malitere ibu eze; ọ we buru eze Israel arọ abua.


Samuel we si, Gini ka i meworo? Sọl we si, N'ihi na ahurum na ndi Israel esiwo n'ebe m'nọ b͕asa, ma gi onwe-gi abiaghi n'ubọchi akara àkà, ndi Filistia nāchikọta kwa onwe-ha na Mikmash;


Samuel we bilie, si na Gilgal rigorue Gibea Benjamin. Sọl we gukota ndi Israel, bú ndi ahutara n'aka-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri.


Sọl, na Jonatan nwa-ya, na ndi ahutara n'aka-ha, we nọdu na Geba Benjamin: ma ndi Filistia mara ulo-ikwū-ha na Mikmash.


Ndi ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia we pua rue ngabiga Mikmash.


Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.


Ha we tib͕ue ufọdu nime ndi Filistia n'ubọchi ahu site na Mikmash rue Ajalon: ndi Israel we da #mbà nke-uku.


Otù ọnu bu ogidi n'akuku Ugwu na ncherita-iru Mikmash, nke-ọzọ n'akuku Ndida na ncherita-iru Geba.


Agha we sie ike megide ndi Filistia ubọchi nile nke Sọl: mb͕e Sọl huru nwoke ọ bula bu dike, ma-ọbu nwoke ọ bula bu dìnkpà, o were ya n'onwe-ya.


Samuel we la na Rema; Sọl we rigorue ulo-ya, rue Gibea nke Sọl.


Ọ biarue ogige ìgwè ewu na aturu n'uzọ, ọb͕à di kwa n'ebe ahu; Sọl we ba ikpuchi ukwu-ya. Ma Devid na ndikom-ya nānọdu n'akuku ime ọb͕à ahu.


Sọl we bilie, rida rue ọzara Zif, ya na nnù ndikom asa na ọgu iri, ndi arọputara nke Israel, ichọ Devid n'ọzara Zif.


O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya na n'elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n'iru ub͕ọ-ala-ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan