Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 12:2 - Bible Nso

2 Ma ub͕u a, le, eze ahu nējeghari n'iru unu: ma mu onwem aghọwo agadi na onye-isi-awọ; ma umum ndikom, le, ha nọ n'etiti unu: ma mu onwem ejeghariwo n'iru unu site na mb͕e m'di na nwata rue ta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ugbu a, unu enweela eze, onye bụ onyendu unu. Ma nʼebe mụ onwe m nọ, abụrụla m agadi isi awọ, ụmụ m ndị ikom so nọrọkwa nʼetiti unu. Abụ m onyendu unu site na mgbe m bụ okorobịa ruo taa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 12:2
17 Iomraidhean Croise  

Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.


onye ganāpu apu n'iru ha, onye ganābà kwa abà n'iru ha, onye ganēme kwa ka ha nāpu apu, onye ganēme kwa ka ha nābà abà; ka nzukọ Jehova we ghara idi ka ìgwè ewu na aturu nke nēnweghi onye-ọzùzù.


N'ihi na anāwusim ub͕u a dika àjà-ihe-ọṅuṅu, oge ulam eruwo kwa.


O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri site na mb͕e Jehova mere ka Israel zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha nile buruburu, mb͕e Joshua ghọrọ agadi, mb͕e ubọchi ndu-ya nāgwu,


na Joshua kpọrọ Israel nile, bú ndi-okenye-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha, si ha, Mu onwem aghọwo agadi, ubọchi ndum nāgwu:


ebe m'matara na ntupu nke ulo-ikwūm nka nābia ọsọsọ, ọbuná dika Onye-nwe-ayi Jisus Kraist gosirim.


Ma Ilai emewo agadi nke-uku; o we nu ihe nile umu-ya ndikom nēme Israel nile, na otú ha nēso ndinyom ahu dina, bú ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.


N'ìhi gini ka unu nāzọkwasi àjàm ukwu, zọkwasi kwa onyinye-inata-iru-ọmam, nke M'nyeworo n'iwu n'ebe-obibim; i we nāsọpuru umu-gi ndikom karim, ime onwe-unu ka unu ma abuba site n'ihe kachasi nma nke onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke Israel, bú ndim?


Jehova we bia, guzo Onwe-ya, kpọ òkù dika Ọ kpọrọ ub͕ò nile, si, Samuel, Samuel. Samuel we si, Kwue; n'ihi na orù-Gi nānu.


Egosiwokwam ya na Mu onwem nēkpe ulo-ya ikpe rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ajọ omume nke ọ mara, n'ihi na umu-ya ndikom nēwetara onwe-ha nkọcha, ma o b͕ochighi ha.


Ilai we kpọ Samuel, si, Samuel, nwam. O we si, Lem.


O rue, mb͕e Samuel ghọrọ agadi, na o doro umu-ya ndikom ndi-ikpe ikpe Israel.


ka ayi we di, ọbuná ayi onwe-ayi, ka mba nile; ka eze-ayi we nēkpe kwa ayi ikpe, nāpu kwa je n'iru ayi, nēbu kwa agha-ayi.


Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n'uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé.


ha we si ya, Le, gi onwe-gi aghọwo agadi, ma umu-gi ndikom adighi-eje ije n'uzọ-gi nile: ub͕u a mere ayi eze ikpe ayi ikpe dika mba nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan