16 Ub͕u a kwa guzonu onwe-unu, hu ihe uku a, nke Jehova nēme n'anya-unu.
16 “Ugbu a, na-elenụ anya ka unu hụ ọrụ ịtụnanya niile Onyenwe anyị na-aga ịrụ.
Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.
Israel we hu aka uku nke Jehova ji megide ndi Ijipt, ndi Israel we tua egwu Jehova, kwere na Jehova, na n'orù-Ya Moses.
Ma ub͕u a, guzonu onwe-unu, ka mu na unu we kpe ikpe n'iru Jehova bayere ezi omume nile nke Jehova, nke O mere unu na nna-unu-hà.
Samuel we si Sọl, Ra aka, m'gēgosi kwa gi okwu nke Jehova gwaworom n'abali a. O we si ya, Kwue.