Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 12:12 - Bible Nso

12 Unu we hu na Nehash, bú eze umu Amom, biara imegide unu, unu we sim, É-è, kama otù eze gāburu ayi eze: ma Jehova, bú Chineke-unu, bu eze-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu bụ eze unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 12:12
15 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke.


Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie, Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa


N'ihi na Jehova bu onye-ikpe-ayi, Jehova bu onye nēnye ayi iwu, Jehova bu eze-ayi; Ya onwe-ya gāzoputa ayi.


Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n'etiti umu Amon, na n'Edom, na ndi nọ n'ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha;


Òle ebe eze-gi nọ ub͕u a, ka o we zọputa gi n'obodo-gi nile? òle ebe ndi-ikpe-gi nọ, ndi i kwuru okwu bayere ha, si, Nyem eze na ndi-isi?


O legideghi ajọ ihe anya nime Jekob, Ọ hughi kwa nmeb͕u n'Israel: Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya, Iti-nkpu nke eze di kwa n'etiti ha.


Gideon we si ha, Mu onwem agaghi-achi unu, nwam agaghi-achi kwa unu: Jehova gāchi unu.


ma unu onwe-unu ebiliwo imegide ulo nnam ta, b͕u kwa umu-ya ndikom, bú ọgu ndikom atọ na iri, n'elu otù nkume, me kwa Abimelek, bú nwa orù-ya nwayi, eze ndi-nwe Shekem, n'ihi na nwa-nne-unu ka ọ bu;)


ma unu onwe-unu ajuwo Chineke-unu ta, Onye Ya onwe-ya nāzọputa unu n'aka ihe ọjọ unu nile na nkpab͕u nile unu; unu we si Ya, É-è, kama mere ayi eze. Ma ub͕u a guzonu onwe-unu n'iru Jehova n'ebo nile unu, na n'usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri unu.


Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n'uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan