Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 10:5 - Bible Nso

5 Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 “Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 10:5
27 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e etiti-ehihie gasiri, na ha nēbu amuma rue mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di.


Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko na ncherita-iru ya we hu ya, si, Mọ Elaija anọkwasiwo Elaisha. Ha we bia izute ya, ha we kpọrọ ya isi ala.


Umu ndi-amuma ndi nọ na Bet-el we pukute Elaisha, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.


Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko we biarue Elaisha nso, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.


Ọgu ndikom abua na iri n'etiti umu ndi-amuma je-kwa-ra, guzo na ncherita-iru ha n'ebe di anya: ha abua we guzo n'akuku Jọdan.


Ma ub͕u a kutaranum ọkpọ-ubọ. O rue, mb͕e ọkpọ-ubọ ahu nākpọ, na aka Jehova di n'aru ya.


Ma Elaisha biaghachiri rue Gilgal: ma oké unwu di n'ala ahu; umu ndi-amuma nānọdu kwa ala n'iru ya: o we si nwa-okorọbia-ya, Tukwasi ite uku n'ọku, siere umu ndi-amuma ofé.


Umu ndi-amuma we si Elaisha, Biko, le, ebe ayi onwe-ayi nēbi n'iru gi adikara ayi nkpa.


Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.


Devid na Israel nile nēwere ike-ha nile gba egwú n'iru Chineke, were kwa abù, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ájà, na opì.


ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama.


ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;


M'gātọ ntim n'ala n'ilu: M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.


Nēji ubọ nke akwara iri, nēji kwa une; Nēji higgaion n'elu ubọ-akwara.


Nāb͕asonu ihu-n'anya; otú ọ di, werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara nile nke Mọ Nsọ, ma nāchọkarinu ka unu bū amuma.


Ha we biarue ebe ahu, rue ugwu ntà ahu, ma, le, usu ndi-amuma zutere ya; Mọ nke Chineke we dakwasi ya n'ike, o we bū amuma n'etiti ha.


ha gāju kwa gi ajuju bayere udo-gi, we nye gi ob͕e achicha abua; i gānara kwa ha n'aka-ha.


Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n'Israel; nnù ndikom ise we di n'aka Sọl nime Mikmash na n'ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n'aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n'etiti ndi Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya.


Jonatan we tib͕ue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia nke di na Geba, ndi Filistia we nu ya. Sọl we fùa opì-ike n'ala ahu nile, si, Ka ndi-Hibru nu.


Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid: ha we hu nzukọ ndi-amuma ahu ka ha nēbu amuma, ha hu kwa Samuel ka ọ nēguzo, dika onye-isi-ha: Mọ nke Chineke we dikwasi ndi-ozi Sọl, ha onwe-ha we bū kwa amuma.


Ha we za ha, si, Ọ nọ, le, ọ nọ n'iru gi: me ngwa ub͕u a, n'ihi na ta ka ọ batara n'obodo; n'ihi na ndi Israel nwere àjà ta n'ebe di elu a:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan