Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 10:3 - Bible Nso

3 I gēsi kwa n'ebe ahu gabiga n'iru, bia rue osisi terebinth nke Teboa, ma ndikom atọ ndi nārigokuru Chineke rue Bet-el gāhuta gi n'ebe ahu, otù onye nēbu umu-ewu atọ, otù onye nēbu ob͕e achicha atọ, otù onye nēbu kwa karama-akpukpọ manya-vine:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 “Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 10:3
22 Iomraidhean Croise  

Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu.


nkume a, nke m'doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n'uzọ iri.


Chineke we si Jekob, Bilie, rigoro Betel, biri n'ebe ahu: mekwara Chineke ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú Onye mere ka i hu Ya anya mb͕e ināb͕apu n'iru Isọ nwa-nne-gi.


ka ayi bili kwa, rigoro Bet-el; m'gēmekwara Chineke ebe-ichuaja n'ebe ahu, bú Onye nāzam n'ubọchi ahuhum, we nọyerem n'uzọ nke m'jere.


Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha: Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi.


Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n'Anatot, nke di n'ala Benjamin: n'ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M'we mara na okwu Jehova ka nka bu.


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso sitere n'ìgwè ewu na aturu, site n'aturu, ma-ọbu site n'ewu, bú nke ọ nēweta nso ibu àjà-nsure-ọku; oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso.


Onyinye-inata-iru-ọma-ya gābu uzọ abua n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour agwara manu, bú àjà-ọku anāchuru Jehova ibu ísì utọ: àjà-ihe-ọṅuṅu-ya gābu kwa manya-vine, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin.


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ewu, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova.


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso, nke, ọ nēnye ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo ichuru Jehova, esi n'ìgwè ewu na aturu puta; oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso.


N'elu ob͕e achicha koro eko ufọdu ka ọ gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso tiyere àjà-ekele nke àjà-udo-ya.


o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia;


ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha.


Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.


(Umu Israel we rigo, kwa ákwá n'iru Jehova rue anyasi; ha we jua Jehova ase, si, M'gābiaru kwa nso ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha? Jehova we si, Rigonu megide ya.)


Umu Israel we jua Jehova ase, (n'ihi na n'ebe ahu ka ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke di na mb͕e ahu,


Ha we gosi Sisera na Berak nwa Abinoam arigowo n'ugwu Teboa.


O zìe kpọ Berak nwa Abinoam ka o si na Kedesh-naftali bia, ọ si ya, Ọ̀ nyeghi iwu, bú Jehova, Chineke nke Israel, si, Je, dọrọ rue n'ugwu Teboa, chiri kwa n'onwe-gi orú nnù ndikom na nnù ise sitere n'umu Naftali, site kwa n'umu Zebulun?


Ọ si Zeba na Zalmuna, Ndikom ahu nke unu b͕uru nime Teboa, hà di aṅa? Ha si, Dika i di, otú a ka ha di; onye ọ bula di ka umu eze n'aru.


ha gāju kwa gi ajuju bayere udo-gi, we nye gi ob͕e achicha abua; i gānara kwa ha n'aka-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan