Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 10:27 - Bible Nso

27 Ma ufọdu ndi jọb͕uru onwe-ha siri, Onye a, ò gēsi aṅa zọputa ayi? Ha we lelia ya, ha ewetaghi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma. O we di ka onye nti chiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 10:27
21 Iomraidhean Croise  

Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel.


O tib͕u-kwa-ra Moab, were udọ̀-ọtùtù tùa ha, me ha ka ha dina ala; o we tùa udọ̀-ọtùtù abua ime ka ha nwua, na udọ̀ ọtùtù zuru ezu ime ka ha di ndu. Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma.


Ndi ahu nēbute kwa, nwoke ọ bula onyinye-inata-iru-ọma-ya, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, na ihe-ekike-agha, na uda di iche iche, na inyinya, na inyinya mule, ihe anēnye n'arọ n'arọ-ya.


Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.


Hairam, bú eze Taia, we zìe ndi-orù-ya jekuru Solomon: n'ihi na ọ nuru na ya ka ha tere manu ibu eze n'ọnọdu nna-ya: n'ihi na onye nāhu Devid n'anya ubọchi nile ka Hairam bu.


Ndikom efu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, b͕a onwe-ha ume imegide Rehoboam nwa Solomon, ma Rehoboam bu nwata di kwa nrò n'obi, o meghi kwa onwe-ya ka ọ di ike n'iru ha.


Jehova we me ka ala-eze guzosie ike n'aka-ya; Juda nile we nye Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma; o we nwe àkù na nsọpuru n'uba.


Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe; Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya.


Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.


Ọzọ, atukwasila obi-gi n'okwu nile anēkwu; ka i we ghara inu ka orù-gi nākọcha gi:


Ma ha b͕ara nkiti, ha azaghi kwa ya okwu: n'ihi na ihe eze nyere n'iwu bu nka, si, Unu azala ya.


Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh.


Moses nka, onye ha juru aju, si, Onye mere gi ka i buru onye-isi na ikpé? onye a ka Chineke ziteworo ibu onye-isi, ibu kwa onye-nb͕aputa, ya na aka mọ-ozi ahu nke emere ka ọ hu ya n'osisi ntà ahu.


Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);


Ndi Israel we si Samuel, Ònye ka ọ bu, bú onye nāsi, Sọl, ọ̀ gābu eze-ayi? nyenu ayi ndikom ahu, ka ayi we me ka ha nwua.


Sọl we si, Ọ dighi nwoke agēme ka ọ nwua ta: n'ihi na ta ka Jehova zọputara nzọputa n'Israel.


Jesi we were otù inyinya-ibu nke eboro ya achicha, na otù karama-akpukpọ manya-vine, na otù nwa-ewu, we zigara Sọl n'aka Devid, bú nwa-ya.


Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.


Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan