Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 10:22 - Bible Nso

22 Ha we ju kwa Jehova ase ọzọ, si, Ọ̀ kābiaghi ebe a, bú nwoke ahu? Jehova we si, Le, onye ahu ezowo onwe-ya n'etiti ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 10:22
19 Iomraidhean Croise  

Umu-ya we b͕a nb͕a nime afọ ya; ọ si, Ọ buru na ọ di otú a, n'ìhi gini kwa ka mu onwem di ndu? Ọ we je iju Jehova ase.


O rue, ka nka gasiri, na Devid juru Jehova ese, si, M'gārigo n'otù nime obodo Juda? Jehova we si ya, Rigo. Devid we si, Òle ebe M'gārigo? Ọ si, Rue Hebron.


Oké unwu we di n'ubọchi Devid arọ atọ n'usoro, arọ na arọ; Devid we chọ iru Jehova. Jehova we si, Ọ bu n'ihi Sọl na n'ihi ulo ọbara ya, n'ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua.


Ọ bu kwa n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n'ikpé Ìhe ahu n'iru Jehova: n'okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n'okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile.


N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.


O rue, mb͕e ọnwu Joshua gasiri, na umu Israel juru Jehova ase, si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi imegide ndi Kenean, ibuso ha agha?


Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.


(Umu Israel we rigo, kwa ákwá n'iru Jehova rue anyasi; ha we jua Jehova ase, si, M'gābiaru kwa nso ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha? Jehova we si, Rigonu megide ya.)


Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n'iru ya na mb͕e ahu,) si, M'gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m'gāgha? Jehova we si, Rigonu; n'ihi na echi ka M'gēnye ya n'aka-gi.


O we me ka ebo Benjamin biarue nso n'ab͕uru nile ha, nzà we ma ab͕uru Matri: nzà we ma Sọl nwa Kish: ha we chọ ya, ma achọtaghi ya.


Sọl we jua Jehova ase, si, M'gārida sochie ndi Filistia n'azu? Ì gēnye ha n'aka Israel? Ma Ọ zaghi ya n'ubọchi ahu.


Samuel we si, Ọ bu ezie na onye ntà ka i bu n'anya gi onwe-gi, ma ọ̀ bughi onye-isi ebo nile nke Israel ka emere gi? Jehova we te gi manu ka i buru eze Israel;


O we juara ya ase n'aka Jehova, nye ya ihe ọ gēri n'uzọ, nye kwa ya mma-agha Gọlaiat onye Filistia.


Devid we mara na ọ bu ya ka Sọl nēcheputa ihe ọjọ megide; o we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, Chita ephod nso.


Devid we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, bú nwa Ahimelek, Biko, chitaram ephod nso. Abaiata we chita ephod ahu nso n'ebe Devid nọ.


Devid we jua Jehova ase, si, Ọ buru na achuam usu a ndi nāpunara madu ihe n'azu, #m'gēru ha aru? Ọ si ya, Chua: n'ihi na i ghaghi iru ha aru, i ghaghi kwa inaputa ha ihe nile.


Sọl we za, si, Ọ̀ bughi onye Benjamin ka m'bu, sitere n'ebo Israel nke dikarisiri ntà? ab͕urum, ọ̀ pekarisighi npe n'etiti ab͕uru nile nke ebo Benjamin? n'ìhi gini kwa ka i gwaworom okwu dika okwu a si di?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan