Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 1:24 - Bible Nso

24 Ma mb͕e o mere ka ọ rapu ara, o we kuru ya n'aka-ya rigo, chiri kwa oke-ehi atọ, na otù ephah utu ọka, na otù karama-akpukpọ manya-vine, we me ka ọ ba n'ulo Jehova na Shailo: nwata ahu bu nání nwata.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 1:24
9 Iomraidhean Croise  

Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n'ubọchi emere ka Aisak rapu ara.


Nwa-nne Tahpenes we muara ya Genubat, bú nwa-ya nwoke, onye Tahpenes mere ka ọ rapu ara n'etiti ulo Fero: Genubat we nọ n'ulo Fero n'etiti umu-ndikom Fero.


Ọ turu ha ilu ọzọ, si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.


ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:


Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa; n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu: agaghi-ahu kwa ha n'iru Jehova n'aka efu:


Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n'ebe ahu: ewe buda ala ahu n'iru ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan