Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 1:23 - Bible Nso

23 Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n'anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Elkena bụ di ya sịrị ya, “Mee ihe ọbụla i chere kwesiri ekwesi. Nọdụ ruo mgbe ọ hapụrụ ịṅụ ara, ma ka Onyenwe anyị mezuo okwu ya.” Hana nọgidere nʼụlọ tutu ruo mgbe ọ zụlitere nwantakịrị ahụ, kwụsị ya ịṅụ ara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 1:23
12 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, me ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.


M'we bilie n'ututu inye nwam ara, ma, le, ọ nwuwo: m'we tule ya n'ututu, ma, le, ọ bughi nwam nke m'muru.


Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem: I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem.


abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M'gēwuli kwa:


Ma ọ buru na di-ya emebisia ha n'ubọchi ọ nuru ha; ihe ọ bula nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya puta bayere nkwa-ya nile, ma-ọbu nke bayere isọ-nsọ nke nkpuru-obi-ya, ọ gaghi-eguzosi ike: di-ya emebiwo ha; Jehova gāb͕aghara kwa ya.


Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.


O we rue, mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, na otù nwanyi si n'etiti ìgwè madu ahu weli olu-ya, si Ya, Ngọzi nādiri afọ nke buru Gi, na ara nke I miri.


Ilai we za, si, La n'udo: Chineke Israel nye kwa gi aririọ-gi nke i riọworo n'aka-Ya.


Sọl we si, Ka ayi rida sochie ndi Filistia n'azu n'abali, luta ihe-ha n'agha rue ìhè ututu, ka ayi ghara kwa ikwe ka nwoke fọdu n'etiti ha. Ha we si, Me ihe ọ bula nke di nma n'anya-gi. Onye-nchu-àjà we si, Ka ayi biarue Chineke nso n'ebe a.


O we si Israel nile, Unu onwe-unu nọ n'otù ofè, mu onwem na Jonatan nwam gānọ kwa n'ofè nke-ọzọ. Ndi Israel we si Sọl, Me ihe nke di nma n'anya-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan