Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 1:17 - Bible Nso

17 Ilai we za, si, La n'udo: Chineke Israel nye kwa gi aririọ-gi nke i riọworo n'aka-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Elayị zara sị ya, “Laa nʼudo, ka Chineke Izrel mezuoro gị dịka arịrịọ gị niile si dị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 1:17
14 Iomraidhean Croise  

Aisak we riọ Jehova aririọ n'ihi nwunye-ya, n'ihi na nwayi-àgà ka ọ bu: Jehova we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, Rebeka, bú nwunye-ya, we turu ime.


Eze we si ya, Je n'udo. O we bilie, jerue Hebron.


Ọ si ya, La n'udo. O we si n'ebe ọ nọ je n'uzọ-ya nwantī.


Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n'ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m'pua n'ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru.


Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike.


O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.


Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.


Onye-nchu-àjà ahu we si ha, Jenu n'udo: na ncherita-iru Jehova ka uzọ-unu di, nke unu nēje ije nime ya.


Agula orù-gi nwayi na nwayi jọb͕uru onwe-ya: n'ihi na ọ bu n'ọtutu ntughari-uchem na nkpasu-iwem ka m'siteworo kwue okwu rue ub͕u a.


Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n'anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara.


Jonatan we si Devid, La n'udo, n'ihi na ayi aṅuwo iyi, ayi abua, n'aha Jehova, si, Jehova gānọ n'etiti mu na gi, na n'etiti nkpurum na nkpuru-gi, rue mb͕e ebighi-ebi. O we bilie, la: Jonatan we ba n'obodo.


Devid we nara n'aka-ya ihe o wetara ya: ọ si ya, Rigorue ulo-gi n'udo; le, egewom nti olu-gi, hu kwa gi iru-ọma.


Ma ub͕u a, laghachi, je kwa n'udo, ka i we ghara ime ihe ọjọ n'anya ndi-isi ndi Filistia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan