Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Samuel 1:11 - Bible Nso

11 Ọ we kwe nkwa, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ buru na I lekwasi anya n'ezie na nweda-n'ala nke orù-Gi nwayi, ọ buru na I chetam, ghara ichezọ orù-Gi nwayi, we nye orù-Gi nwayi nwa-nwoke, m'gēnye kwa ya Jehova ubọchi ndu-ya nile, aguba agaghi-aga kwa n'elu isi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 O kwere nkwa sị, “O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Samuel 1:11
25 Iomraidhean Croise  

Jekob we kwe nkwa, si, Ọ buru na Chineke gānọyerem, debem n'uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m'we rie, na uwe ka m'we yie,


Lia we turu ime, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Reuben: n'ihi na ọ siri, N'ihi na Jehova elekwasiwo nweda-n'alam anya; n'ihi na ub͕u a dim gāhum n'anya.


Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya.


Ma Chineke chetara Noa, na anu nile di ndu, na anu-ulo nile nke ya na ha nọ n'ub͕ọ; Chineke we me ka ifufe gabiga n'elu uwa, miri we taba;


Eleghi anya Jehova gēlekwasi nwedam anya, Jehova gēnyeghachikwam ezi ihe n'ọnọnọdu nkọcha-ya ta.


Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm; Bupu kwa nmehiem nile.


Ndi ahu we kwere: mb͕e ha nuru na Jehova letarari umu Israel, na Ọ hu-kwa-rari nweda-n'ala nke ha, ha rube isi kpọ isi ala.


Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm? Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?


Mb͕e i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n'ikwughachi ya; n'ihi na ihe ndi-nzuzu adighi-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya.


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e onye ọ bula gēmezu nkwa, dika okwu si di ka madu nile gāburu Jehova.


Israel we kwere Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye ndi nka n'akam n'ezie, m'gēwezuga kwa obodo-ha nile ka ebibie ha.


Onye-nchu-àjà gēme otù ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, o gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, n'ihi nmehie nke ọ mehiere site na madu ahu nwuru anwu, o gēdo kwa isi-ya nsọ n'ubọchi ahu.


Ubọchi nile nke nkwa nkwaputa-ya ọ dighi aguba gāgabiga n'isi-ya: rue ozùzù ubọchi nile, nke ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya nsọ ka ọ gādi, ọ gēme ka ntutu agiri-isi-ya to ogologo.


Ubọchi nile nke nkewaputa-ya nsọ ka ọ diri Jehova.


Jefta we kwe Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye umu Amon n'akam n'ezie,


n'ihi na, le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke: aguba agaghi-aga n'elu isi-ya: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ: ya onwe-ya gāmalite kwa izọputa Israel n'aka ndi Filistia.


O we di Hana ilu na nkpuru-obi, o we kpere Jehova, kwasie ákwá ike.


O rue, mb͕e o kpere ọtutu ekpere n'iru Jehova, na Ilai nāriba ọnu-ya ama.


Ha we bilie n'isi-ututu, kpọ isi ala n'iru Jehova, we lata, ba n'ulo-ha, rue Rema: Elkena we mara aru Hana nwunye-ya; Jehova we cheta ya.


Ma Hana arigoghi; n'ihi na ọ siri di-ya, rue mb͕e agēme ka nwata rapu ara, m'gēme kwa ka ọ bia, ka ewe hu ya anya n'iru Jehova, o we biri n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi.


Ekpere bayere nwata nka ka m'kpere; Jehova we nyem aririọm nke m'riọrọ n'aka-Ya:


ọzọ kwa, mu onwem emewo ka ariọtara ya Jehova; ubọchi nile ọ nādi ndu ya onwe-ya bu onye ariọtaworo nye Jehova. Ilai we kpọ isi ala nye Jehova n'ebe ahu.


Ilai we gọzie Elkena na nwunye-ya, si, Jehova doro gi nkpuru site na nwayi a n'ọnọdu ihe-nriọta ariọtara Jehova. Ha we la n'ebe-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan