Ma mb͕e Rechel huru na ọ mughi umu nye Jekob, Rechel we kwo nwa-nne-ya nwayi ekworo. ọ si Jekob, Nyem umu, ma ọ buru na inyeghm, onye nwuru anwu ka m'bu.
Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.
Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n'ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali.
Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.
Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n'ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n'anyam nke-uku, anya-miri ewe si n'anyam rùda, n'ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n'agha.
Unu akwalara onye nwuru anwu ákwá, unu egosi-kwa-la ya ebere unu nwere n'aru ya: kwasierenu onye-ije ahu ike; n'ihi na ọ gaghi-alata kwa ọzọ, ọ gaghi-ahu kwa ala amuru ya ọzọ.
Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,
Ọ we kwe nkwa, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ buru na I lekwasi anya n'ezie na nweda-n'ala nke orù-Gi nwayi, ọ buru na I chetam, ghara ichezọ orù-Gi nwayi, we nye orù-Gi nwayi nwa-nwoke, m'gēnye kwa ya Jehova ubọchi ndu-ya nile, aguba agaghi-aga kwa n'elu isi-ya.
Hana we bilie mb͕e ha risiri ihe nime Shailo, mb͕e ha ṅusikwara ihe-ọṅuṅu. Ma Ilai, bú onye-nchu-àjà, nānọkwasi n'oche-ya n'akuku awara-uzọ ulo uku Jehova.