Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Pita 5:9 - Bible Nso

9 ma nēguzogidenu ya, n'ihi na unu di ike n'okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n'aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n'uwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Pita 5:9
24 Iomraidhean Croise  

ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike.


Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.


nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.


Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.


enye-kwa-la ekwensu uzọ.


tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya.


N'ihi na ọ bu ezie na anọghm n'etiti unu n'anu-arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.


ka ewe ghara ikwaghari onye ọ bula nime nkpab͕u ndia; n'ihi na unu onwe-unu matara na ọ bu n'ihi nka ka edoro ayi.


Nāb͕asi nb͕a ọma nke okwukwe ike, jide ndu ebighi-ebi aka nke akpọrọ gi ka i nata ya, i kwuputa-kwa-ra nkwuputa ọma ahu n'iru ọtutu ndi-àmà.


E, agēsob͕u kwa ndi nile ndi nāchọ idi ndu n'uzọ isọpuru Chineke nime Kraist Jisus.


Ab͕asiwom nb͕a ọma ahu, ab͕asiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu:


ndi sitere n'okwukwe lub͕u ala-eze, lu ọlu ezi omume, nata nkwa di iche iche, kpuchita ọnu ọdum,


Ma ọ buru na adighi-ezí unu ihe site n'inye unu ahuhu, nke emeworo unu niile ka ha buru ndi-nketa, ya mere unu bu umu iko, unu abughi kwa umu n'ezie.


Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ.


Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n'ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà,


N'ihi na akpọrọ unu ime nka: n'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n'ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile:


Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri;


kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya.


Mu onwem, bú Jọn, nwa-nna-unu na onye nēso unu nwekọ nkpab͕u na ala-eze na ntachi-obi nke di nime Jisus, emere ka m'nọ n'agwe-etiti ahu nke anākpọ Patmọs, n'ihi okwu Chineke na àmà Jisus.


Ewe nye ha n'otù n'otù uwe-nwuda di ọcha; ewe si ha, ka ha zuru ike nwa oge ọzọ, rue mb͕e ndi-orù-ibe-ha na umu-nna-ha gēzu kwa ezù, bú ndi agaje ib͕u dika eb͕u-kwa-ra ha onwe-ha.


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan