Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Pita 5:12 - Bible Nso

12 Site n'aka Silvanọs, nwa-nna-ayi kwesiri ntukwasi-obi, dika m'nāgu ya, ka m'nēdegara unu akwukwọ n'okwu ole-na-ole, nāriọ unu, nāb͕a kwa àmà na nka bu amara Chineke n'ezie: nēguzosinu ike nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Pita 5:12
24 Iomraidhean Croise  

Ya mere Pita, mb͕e ọ huru ya, ọ si Jisus, Onye-nwe-ayi, ma onye a, gini gēme ya?


onye, mb͕e ọ biaruru, mb͕e ọ hu-kwa-ra amara Chineke, ọ ṅuria; o we riọ ha nile, ka ha zube n'obi-ha inọgide n'ebe Onye-nwe-ayi nọ:


Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist:


Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.


Onye ayi sitewo-kwa-ra n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n'olile-anya nke otuto Chineke.


Ma emem ka unu mara, umu-nnam, ozi ọma ahu nke m'zìri unu, nke unu nata-kwa-ra, nke unu nēguzo kwa nime ya,


N'ihi na Ọkpara Chineke, Jisus Kraist, Onye ekwusara n'etiti unu site n'ọnu-ayi, bú site n'ọnu nkem na nke Silvanọs na nke Timọti, emeghi Ya ka Ọ buru e na é-è, kama emewo ka e di nime Ya.


Ọ bughi na ayi bu ndi-nwe okwukwe-unu, kama ayi bu ndi soro unu nālu ọṅù-unu: n'ihi na unu ji okwukwe-unu guzo.


na emere ka m'mara ihe-omimi ahu n'uzọ nkpughe, dika m'deworo n'akwukwọ a na mbu n'okwu ole-na-ole,


Ma ka unu onwe-unu we mata kwa ihe nile bayerem, otú m'nēme, Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, bu kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi nime Onye-nwe-ayi, ọ gēme ka unu mara ihe nile:


dika unu mutara n'ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n'anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ijere Kraist ozi n'ọnọdu ayi,


Madu nke gēme ka unu mara ihe nile bayere mu onwem bu Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, buru kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi, buru kwa orù-ibem nime Onye-nwe-ayi:


Anamezite kwa Ọnisimọs, bú nwa-nna-ayi ahu kwesiri ntukwasi-obi, onye ahu-kwa-ra n'anya, onye bu otù onye n'etiti unu. Ha gēme ka unu mara ihe nile nke anēme n'ebe a.


Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo.


Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ:


Ma ariọm unu, umu-nnam, nānagidenu okwu aririọ a: n'ihi na anamewere okwu ole-na-ole degara unu akwukwọ-ozi.


N'ihi nka kenu ihe-ọkiké a n'úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n'amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist;


dika unu nile n'otù n'otù natara onyinye-amara, werenu ihe ahu nējerita onwe-unu ozi, dika ndi nāchi èzi-na-ulo nke-ọma n'amara Chineke nke di n'uzọ di iche iche;


N'ihi nka mb͕e dum agajem ichetara unu ihe ndia, ọ bu ezie na unu matara ha, emewo kwa ka unu guzosie ike n'ezi-okwu ahu nke dinyere unu.


ha rapuru uzọ guzosiri ike eguzo, we jehie, ebe ha soro uzọ Belam nwa nke Beoa, onye huru ugwọ-ọlu nke ajọ omume n'anya;


Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie.


Ndi m'huru n'anya, ebe m'nānu ọku nile n'obi idegara unu akwukwọ bayere nzọputa ahu azọputakọrọ ayi, ọ dim nkpà idegara unu akwukwọ nāriọ unu ka unu nāb͕asi nb͕a ike n'ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n'aka nání otù mb͕e idebe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan