Ka onye ọ bula n'etiti unu nye dika o buru uzọ rọputa n'obi-ya; ọ bughi site na nwuta, ma-ọbu site na nkpà: n'ihi na Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n'anya.
Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe;
kama ọ ghaghi ibu onye nēle ndi-ọbìa nke-ọma, onye nāhu ezi ihe n'anya, onye uche-ya zuru okè, onye ezi omume, onye di ọcha n'obi, onye nējidesi onwe-ya ike;