Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Pita 3:9 - Bible Nso

9 ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Pita 3:9
26 Iomraidhean Croise  

Josef we nye iwu, ha we kpojue ihe nile ha n'ọka, o nye kwa iwu inyeghachi ego-ha, nke onye ọ bula n'akpa-ya, na inye ha ihe ha gēri n'uzọ: ewe mere ha otú a.


Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.


Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ: Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.


Onye nēme ka ndi ziri ezi waghari n'uzọ ọjọ, N'olùlù nke aka ya ka ya onwe-ya gādabà: Ma ndi zuru okè gēketa ezi ihe.


Ọzọ, onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne ndikom, ma-ọbu umu-nne ndinyom, ma-ọbu nna, ma-ọbu nne, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihi aham, ọ gānata ọgu ise ọgu ise, keta kwa ndu ebighi-ebi.


Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa:


ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ.


ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;


Mb͕e ọ nāpu n'uzọ, otù onye we b͕akuru Ya, b͕uru Ya ikperè, jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi?


Ma le, otù onye-iwu biliri, we nwa Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi?


Otù onye-isi we jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi?


Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu.


Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile.


Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.


ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto.


ka ngọzi nke Abraham we rue ndi mba ọzọ nime Kraist Jisus; ka ayi we site n'okwukwe ahu nara nkwa Nke bu Mọ Nsọ.


nweritanu obiọma n'aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.


Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ.


N'ihi na unu matara na ọbuná mb͕e ọ chọrọ iketa ngọzi ahu mb͕e emesiri, ajuru ya (n'ihi na ọ hughi ọnọdu nke nchèghari), ọ bu ezie na o were anya-miri chọsie ya ike.


si, Me-elu-me-ala n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme ka i ba uba.


Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.


Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n'akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan