Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Pita 3:7 - Bible Nso

7 Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Pita 3:7
20 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, chirinu n'onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n'ihi na n'ezie ọ bu ya ka M'gāhu iru-ọma, ka M'ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru.


Ọzọ, asim unu, na ọ buru na madu abua n'etiti unu gēnwe otù olu n'elu uwa bayere ihe ọ bula ha gāriọ, agēme ya nye ha site na Nnam Nke bi n'elu-igwe.


Ka di kwughachi nwunye-ya ugwọ o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwughachi kwa di-ya ugwọ o ji ya.


bú, na ndi mba ọzọ bu ndi soro ayi ketakọ ihe, na idikọ n'otù aru, na ikèkọ nkwa ahu nime Kraist Jisus site n'ozi ọma,


Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa.


Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.


site-kwa-nu n'ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n'oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka,


Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n'ebe ha nọ.


ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n'odido-nsọ na nsọpuru,


ka, ebe ewere amara-Ya gua ayi na ndi ezi omume, ka ayi we ghọ ndi-nketa dika olile-anya nke ndu ebighi-ebi si di.


Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?


Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan