Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Pita 3:22 - Bible Nso

22 Onye nọ n'aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n'elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n'okpuru Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 onye nọ nʼeluigwe, nʼaka nri Chineke, ebe ndị mmụọ ozi niile, na ịchị isi niile, na ike niile na-erube isi nye ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Pita 3:22
24 Iomraidhean Croise  

Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.


Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gētiye ndi-iro-Gi n'okpuru ukwu-Gi abua?


Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem.


Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.


Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n'elu-igwe, O we nọdu n'aka-nri nke Chineke.


N'ihi na Devid onwe-ya nēkwu n'akwukwọ Abù ọma, si, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim,


Chineke gēnye kwa Ya otuto nime Onwe-ya, ngwa ngwa ka Ọ gēnye kwa Ya otuto.


ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n'elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu nọ rigo n'elu-igwe, gābia n'otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n'elu-igwe.


Onye elu-igwe aghaghi inara nke-ọma rue oge agēme ka ihe nile di ka ha di na mbu, bù oge nke Chineke kwuru okwu bayere ha site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ ndi sitere na nmalite oge a.


Ònye bu onye ahu nke gāma ikpé? Ọ̀ bu Kraist Jisus Onye nwuru, ma nke kariri, emere Ya ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye nọ n'aka-nri Chineke, Onye nāriọ-kwa-ra ayi aririọ?


N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche,


Emesia ọgwugwu ihe nile gābia, mb͕e ọ bula Ọ gārara ala-eze-Ya nye n'aka Chineke, Onye bu kwa Nna; mb͕e ọ bula Ọ gēmewori ka ọbubu-isi nile na ichi-isi nile na ike nile ghara idi irè.


Ya mere, ọ buru na unu soro Kraist-ayi bilikọ, nāchọnu ihe di n'elu, ebe Kraist-ayi nọ, nānọdu n'aka-nri Chineke.


Ma ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua?


Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;


Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.


ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, O we nọdu n'aka-nri Chineke mb͕e nile;


nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.


Ya mere ebe ayi nwere Onye-isi-nchu-àjà di uku, Onye gabigaworo eluigwe nile, bú Jisus Ọkpara Chineke, ka ayi jidesie nkwuputa-ayi ike.


n'ebe Jisus batara n'ihi ayi dika onye nēbu uzọ b͕a ọsọ, ebe emere Ya ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro nke Melkizedek si di.


Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,


N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan