Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Pita 3:14 - Bible Nso

14 Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. “Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Pita 3:14
29 Iomraidhean Croise  

Atula egwu site n'oké egwu mberede, Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia;


Atula egwu iru-ha: n'ihi na gi ka M'nọyere inaputa gi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Gi mara, Jehova: chetam, letakwam, we bọ̀rọm ndi nēsob͕um ọ́bọ̀; ewepulam n'eweghi-iwe-ọsọsọ nke Gi: mara na eburuwom ita-uta n'ihi Gi.


Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ.


Ya mere, unu atula egwu; ọnu-ahia unu onwe-unu kariri nke ọtutu egwele.


Onye chọtara ndu-ya gētufu ya; onye tufu-kwa-ra ndu-ya n'ihim gāchọta ya.


N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim, ọ gāhu ya.


Ọzọ, onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne ndikom, ma-ọbu umu-nne ndinyom, ma-ọbu nna, ma-ọbu nne, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihi aham, ọ gānata ọgu ise ọgu ise, keta kwa ndu ebighi-ebi.


Jisus siri, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne-ndikom, ma-ọbu umu-nne-ndinyom, ma-ọbu nne, ma-ọbu nna, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihim, na n'ihi ozi ọma nkem,


N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim na n'ihi ozi ọma nkem, ọ gāzọputa ya.


Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu.


Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ.


n'ihi na Mu onwem gēgosi ya ka ha ra, bú ahuhu nile ọ nāghaghi ihu n'ihi aham.


N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.


n'ihi na unu ka enyeworo ya n'amara n'ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n'ihi Ya:


Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n'ọnwunwa: n'ihi na mb͕e anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahu, bú ndu, nke Onye-nwe-ayi kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya.


Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere.


dika Sera ṅara Abraham nti, nākpọ ya onye-nwe-ya: onye emere unu ka unu buru umu-ya, ma ọ buru na unu eme ezi ihe, ghara kwa itu egwu site n'ujọ ọ bula.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan