Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Pita 2:8 - Bible Nso

8 na, Nkume isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà; n'ihi na ha nāsu ngọngọ n'okwu ahu, ebe ha nēkweyeghi ekweye: edo-kwa-ra ha ka ha me ihe a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ bụ kwa, “Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa.” Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Pita 2:8
16 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm: Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya.


ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile.


Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M'meworo ya, na ọ bu site n'ubọchi mb͕e ochie ka M'kpuworo ya? ugbu a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n'efu.


Ọ gāsi kwa, Tulienu, tulienu, dozienu uzọ, bupunu ihe-isu-ngọngọ n'uzọ ndim.


Ọ gāghọ kwa ebe nsọ; ma Ọ gāghọrọ ulo abua nke Israel nkume ikpọbì-ukwu na oké nkume isu-ngọngọ, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem ib͕udu na ọnyà.


Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;


Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì:


ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu;


n'ebe ndia nọ ọ bu isìsì nke sitere n'ọnwu we dubà n'ọnwu; n'ebe ndi ahu anāzọputa nọ ọ bu isìsì nke sitere na ndu we dubà na ndu. Ma ònye ruru ime ihe ndia?


Ma mu onwem, umu-nnam, ọ buru na anọm nēkwusa ibì-úgwù, gini mere anọ nēsob͕um? m'kwusa otú a, emewo ka ọnyà nka, bú obe, ghara idi irè.


N'ihi na Chineke edebeghi ayi inata iwe, kama inweta nzọputa site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,


N'ihi na ekwuru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Le, anamatọb͕ọ na Zaion otù isi nkume nime nkuku ntọ-ala, nke bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru: Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya ma-ọli.


Ya mere ọ bu unu, bú ndi kwere ekwe, ka nsọpuru ahu diri: ma n'ebe ndi nādighi-ekwe nọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo;


Nime anya-uku ka ha gēji kwa okwu nrafu di iche iche were unu zua ahia: ndi ọmuma-ikpe-ha nābughi ihe nādighi-alu ọlu site n'oge ochie, ila-n'iyì-ha adighi-atu kwa ura.


N'ihi na madu ufọdu b͕ebàra, bú ndi ewereworo ha gosi ọra madu mb͕e ochie ka ewe ma ha ikpé a, ndi nādighi-asọpuru Chineke, ndi nāgha amara Chineke-ayi ka ọ buru agu ikwa-iko, ndi nāgọnari kwa Onye nání Ya bu Nna-nwe-ọra, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan