N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.
n'uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n'iru Chineke nání otù mb͕e iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ub͕ò abua, ma nmehie adighi ya, ka ewe zọputa ha.
Umu-ntakirim, ihe ndia ka m'nēdegara unu n'akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n'ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume: