Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Pita 2:15 - Bible Nso

15 N'ihi na otú a ka ọchichọ nke Chineke si di, ka unu site n'ime ezi ihe me ka amaghi-ihe nke ndi nēnweghi uche kpuchie ọnu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Pita 2:15
23 Iomraidhean Croise  

Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.


Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya, Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.


Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria; Ma ajọ omume nile ekpuchiwo ọnu-ya.


Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n'anya-Gi: I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì.


Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu; Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.


N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.


Ma ise nime ha bu ndi-nzuzu, ise bu kwa ndi nwere uche.


Ma onye ọ bula nke nānu okwum ndia, ma ọ dighi-eme ha, agēji ya tuyere nwoke nke bu onye-nzuzu, onye wuru ulo-ya n'elu ájá:


n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri.


Ma ndi Galetia nēnweghi uche, ònye riri obi-unu, ndi ewere Jisus Kraist gosi ọra madu n'anya-unu, dika Onye akpọgidereri n'obe?


Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a, Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe? Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi? Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike.


N'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko;


nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ.


ọ bu ezie na abum onye nēkwulu Chineke na mbu, buru kwa onye-nsob͕u, na onye nēme madu ihe-ihere: otú ọ di, O merem ebere, n'ihi na emerem ya nāmaghi ama nime ekweghi-ekwe;


okwu nke nēnye ezi ndu, nke anāpughi ima ikpe; ka ewe me onye nọ n'akuku ndi nēmegide emegide ihe-ihere n'iru, ebe ọ nēnweghi ihe nādighi nma ikwu bayere ayi.


N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.


nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.


ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya.


N'ihi na ọ ka nma, ma ọ buru na ọchichọ Chineke chọrọ ya, ka unu hu ahuhu n'ihi na unu nēme ezi ihe kama n'ihi na unu nēme ihe ọjọ.


ka unu we ghara ibi ọzọ n'oge fọduru unu n'anu-aru-unu ime ihe ọjọ di iche iche nāgu madu, kama ime ihe Chineke nāchọ.


Ma ndia, dika anu nēnweghi uche, ndi bu anu nzuzu site n'ọmumu-ha inwude na imebi, nēkwulu Chineke n'ihe ha nāmaghi, agēmebi kwa ndia na nmehie ha,


Ma ndia nēkwulu ihe nile, ka ha ra, bú ihe ha nāmatagh: ma ka ha ra, bú ihe ha nāghọta site n'ọmumu, dika anu nēnweghi uche, nime ihe ndia ka anēmebi ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan