Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 9:5 - Bible Nso

5 Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike ikuru nwunye, bú nwa-nna-nwanyi nime Kraist, jeghari, dika ndi-ozi fọduru nēme kwa, ha na umu-nne Onye-nwe-ayi, na Kifas?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọ bụ na anyị enweghị ike iduru nwunye onye bụ onye kwere ekwe gaa ebe ọbụla anyị na-aga dịka ndị ozi ọzọ na-eme, na dịka ụmụnne Onyenwe anyị na Sefas na-emekwa?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 9:5
25 Iomraidhean Croise  

Ubi ab͕ara ogige nke akpachiri akpachi ka nwa-nnem nwayi, bú nwunye ọhu nkem, bu; Ebe-nsuputa-miri akpachiri akpachi, isi-iyi ab͕achiri ab͕achi.


Nwoke a, Ọ̀ bughi Nwa onye-ọ̀kà-ayi? àdighi-akpọ nne-Ya Meri? nà umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas?


Mb͕e Jisus batasiri n'ulo Pita, O we hu nne nwunye-ya ka ọ tọb͕ọrọ n'aru-ọku.


Ma nne nwunye Saimon nēdina n'aru-ọku; ngwa ngwa ha we gwa Ya okwu bayere nwanyi ahu:


Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya.


na Matiu na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Saimon onye anākpọ Zilotis,


Ewe si Ya, Nne-gi na umu-nne-gi nēguzo n'èzí, nāchọ ihu Gi anya.


O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya).


Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi.


Ndia nile ji otù obi nọgidesi ike n'ekpere, ha na ndinyom ufọdu, na Meri nne Jisus, na umu-nne-Ya.


Ma anameme ka unu mara Fibi nwa-nna-ayi nwanyi, onye nējere nzukọ Kraist nke di na Kenkrii ozi:


Ihe m'nēkwu bu nka, na unu nile n'otù n'otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist.


Ma ọ buru na onye ahu nke nēkweghi ekwe ekewapu onwe-ya, ya kewapu onwe-ya: emeghi ka nwa-nna-ayi nwoke ma-ọbu nwa-nna-ayi nwanyi buru orù n'okwu di otú a: ma Chineke akpọwo ayi n'udo.


Ekewo nwunye n'aru di-ya ka oge di-ya nọ na ndu ra; ma asi na di-ya adawo n'ura ọnwu, o nwere onwe-ya ilu di ọ nāchọ; ma ọ bu nání nime Onye-nwe-ayi.


Ma anamachọ ka madu nile di ka mu onwem di kwa. Otú ọ di, madu nile n'otù n'otù nwere onyinye-amara nke aka ha site na Chineke, otù onye otú a, onye ọzọ otú a kwa.


Ma asim ndi nānọghi n'ọnọdu di na nwunye na ndi di-ha nwuru, Ọ diri ha nma ma asi na ha nānọgide dika mu onwem nọ kwa.


Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi.


Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe;


ndi nēb͕ochi madu ilu di na nwunye, ndi si kwa madu erila ihe-oriri di iche iche, nke Chineke kère ka ndi kwere ekwe, ndi mazu-kwa-ra ezi-okwu, ka ndi ahu were ekele nara.


ndinyom, ndi bu okenye, dika ndi bu nne; umu-ab͕ọghọ dika umu-nne-nwanyi, n'idi-ọcha nile.


ọ buru na onye ọ bula bu onye anāpughi ibo ebubo, di nke otù nwunye, nēnwe umu kwere ekwe, bú ndi anēboghi ebubo na ha nādi ndu ila-n'iyì, ndi nābughi kwa ndi nēkweghi inọ n'okpuru iwu.


Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan