Ma mb͕e ọ bula ha kpọrọ unu bia n'iru ulo-nzukọ, na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu:
M'we za ha, si, na ọ bughi ọme-n'ala nke ndi Rom iwere amara rara madu ọ bula nye, ma ọ buru na onye anēbo ebubo ebughi uzọ nwe ndi nēbo ya n'iru ya, hu kwa uzọ igọpu onwe-ya n'ihe eboro ya.
Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye-amuma, ma-ọbu onye nwere onyinye Mọ Nsọ, ya mazu ihe m'nēdegara unu n'akwukwọ, na ha bu ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu.
Ọ buru na abughm onye-ozi n'ebe ndi ọzọ nọ, ma otú ọ di, abum onye-ozi n'ebe unu nọ: n'ihi na akàrà nke ọlu onye-ozi nkem ka unu onwe-unu bu nime Onye-nwe-ayi.
N'ihi nka ka m'nēde ihe ndia n'akwukwọ mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, ka m'we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada.
Nānwanu onwe-unu, ma unu di n'okwukwe-ayi; nānwaputanu onwe-unu. Ma-ọbu ùnu amazughi onwe-unu, na Jisus Kraist nọ nime unu? ma-ọbughi na ọ bu ezie na unu bu ndi ajuru aju.
dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.