Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 9:3 - Bible Nso

3 Ngọpum n'iru ndi nēkpem ikpé bu nka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ihe ngọpụ m nye ndị ahụ na-enyocha m bụ nke a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 9:3
14 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e ọ bula ha kpọrọ unu bia n'iru ulo-nzukọ, na ndi-isi, na ndi nāchi isi, unu echeb͕ula onwe-unu otú unu gāgọpu onwe-unu ma-ọbu ihe unu gēji gọpu onwe-unu, ma-ọbu ihe unu gēkwu:


Umu-nnem na ndi bu nnam, nurunu ngọpum n'ebe unu nọ ub͕u a.


M'we za ha, si, na ọ bughi ọme-n'ala nke ndi Rom iwere amara rara madu ọ bula nye, ma ọ buru na onye anēbo ebubo ebughi uzọ nwe ndi nēbo ya n'iru ya, hu kwa uzọ igọpu onwe-ya n'ihe eboro ya.


Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye-amuma, ma-ọbu onye nwere onyinye Mọ Nsọ, ya mazu ihe m'nēdegara unu n'akwukwọ, na ha bu ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu.


Ọ buru na abughm onye-ozi n'ebe ndi ọzọ nọ, ma otú ọ di, abum onye-ozi n'ebe unu nọ: n'ihi na akàrà nke ọlu onye-ozi nkem ka unu onwe-unu bu nime Onye-nwe-ayi.


Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike iri ihe na iṅu ihe?


N'ihi nka ka m'nēde ihe ndia n'akwukwọ mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, ka m'we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada.


ebe unu nāchọ ihe inwaputa Kraist Onye nēkwu okwu nimem; Onye nābughi onye nādighi ike n'ebe unu nọ, kama Ọ di ike nime unu:


Nānwanu onwe-unu, ma unu di n'okwukwe-ayi; nānwaputanu onwe-unu. Ma-ọbu ùnu amazughi onwe-unu, na Jisus Kraist nọ nime unu? ma-ọbughi na ọ bu ezie na unu bu ndi ajuru aju.


ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n'ikpa-iche-iche, ọ bughi n'idi-ọcha-n'obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n'ab͕um.


dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.


Na ngọpum mbu ọ dighi onye ọ bula nọ n'akukum, kama madu nile rapuru náním: ka aghara igu ya n'isi-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan