Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 9:23 - Bible Nso

23 Ma anameme ihe nile n'ihi ozi ọma, ka m'we ghọ onye nēnwekọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ana m eme ihe ndị a niile nʼihi oziọma, ma ka m nwekwa ike keta oke na ngọzị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 9:23
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim na n'ihi ozi ọma nkem, ọ gāzọputa ya.


Ma ọ buru na anyakapuru alaka ufọdu, ma gi onwe-gi, ọ bu ezie na i bu osisi olive nke ọhia, ma anyakudoro gi n'etiti ha, i ghọ-kwa-ra onye gi na ha nēnwekọ nkpọrọgwu nke umi nke olive ahu;


Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n'ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n'uzọ ọ bula.


N'ebe ndi nādighi ike nọ m'ghọrọ onye nādighi ike, ka m'we rita ndi nādighi ike n'urù: aghọwom ihe nile n'ebe madu nile nọ, ka m'we si n'uzọ ọ bula zọputa ufọdu.


Ùnu amataghi na ndi nāb͕a ọsọ n'ebe ọsọ, ha nile nāb͕a ọsọ, ma ọ bu otù onye nāb͕ata ihe ọsọ? Nāb͕anu otú a, ka unu we b͕ata.


N'ihi na m'sitere na nkpab͕u na ihe-nb͕u nke obi riri nne were ọtutu anya-miri degara unu akwukwọ; ọ bughi ka eme ka o wuta unu, kama ka unu we mara ihu-n'anya nke m'hubigara unu ókè kari.


ndi ayi nēnyeghi uzọ n'uzọ ido onwe-ayi n'okpuru ha, é-è, ọ bughi otù oge hour; ka ezi-okwu nke ozi ọma we nọgide n'etiti unu.


N'ihi nka ka m'nwere ntachi-obi n'ihe nile n'ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi.


Onye-ọlu-ubi nke nādọb͕u onwe-ya n'ọlu aghaghi ibu uzọ kère òkè na nkpuru-ya.


Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;


n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:


Ya mere, ariọm ndi-okenye nọ n'etiti unu, onye mu onwem bu okenye-ibe-unu, ya na onye-àmà nke ahuhu nile nke Kraist, abukwam onye-nnwekọ nke ebube ahu nke agaje ikpughe:


ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan