Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 9:22 - Bible Nso

22 N'ebe ndi nādighi ike nọ m'ghọrọ onye nādighi ike, ka m'we rita ndi nādighi ike n'urù: aghọwom ihe nile n'ebe madu nile nọ, ka m'we si n'uzọ ọ bula zọputa ufọdu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 9:22
12 Iomraidhean Croise  

ma ọ buru na agamakpasu ndi-arum ekworo n'uzọ ọ bula, we zọputa ufọdu n'etiti ha.


Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi.


Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi.


Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ.


Onye ọ bula n'etiti ayi, ya me ihe gātọ onye-ab͕ata-obi-ya utọ iwetara ya ezi ihe, ka ọ we wulie ya elu dika ulo.


dika mu onwem nēme kwa ihe nātọ madu nile n'ihe nile, nāchọghi urù nke akam, kama urù nke madu nile, ka ewe zọputa ha.


N'ihi na ì si aṅa mara, nwunye, ma i gāzọputa di-gi? ma-ọbu ì si aṅa mara, di, ma i gāzọputa nwunye-gi.


N'ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n'ọnyà, m'gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m'ghara ime ka nwa-nnam ma n'ọnyà.


N'ihi na ọ bu ezie na enwerem onwem n'ebe madu nile nọ, ma emerem onwem ka m'buru orù madu nile, ka m'we rita ọtutu madu n'urù kari.


Ma anameme ihe nile n'ihi ozi ọma, ka m'we ghọ onye nēnwekọ ya.


Ònye nādighi ike, nke mu onwem nēsoghi ya n'adighi-ike? ònye ka anēme ka ọ ma n'ọnyà, nke mu onwem nēreghi ọku n'ihi ya?


Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan