Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 9:18 - Bible Nso

18 Gini kwa bu ugwọ-ọlum? Mb͕e m'nēzisa ozi ọma, ka m'we me ka ozi ọma ahu buru ihe ego nādighi nime ya, ka m'ghara ijizu ike nkem inara ihe n'ozi ọma ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 9:18
16 Iomraidhean Croise  

Onye nēwere ihe ubi nānara ugwọ-ọlu-ya, nāchikọta kwa nkpuru nye na ndu ebighi-ebi; ka onye nāgha nkpuru na onye nēwere ihe ubi we ṅuria ọṅu n'otù.


n'ihi na ya na ha nālu otù ọlu-ǹkà ahu, ya na ha we nọgide, nālu kwa ọlu; n'ihi na ọlu-ǹkà-ha bu ikpa ákwà ulo-ikwū.


N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya.


dika mu onwem nēme kwa ihe nātọ madu nile n'ihe nile, nāchọghi urù nke akam, kama urù nke madu nile, ka ewe zọputa ha.


Ma onye nāku na onye nākwọsa miri bu otù: ma ha abua n'otù n'otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu si di.


ka ndi nēji uwa me ihe we di ka ha ejibigaghi ya ókè: n'ihi na uwa nka ka esi ahu ya anya nāgabiga agabiga.


Ma lezienu anya ka ike-unu nka ghara isi n'uzọ ọ bula ghọ ihe gēme ka ndi nādighi ike su ngọngọ.


Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n'ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n'uzọ ọ bula.


Ma mu onwem, ejighm ihe ọ bula n'ihe ndia nara ihe: edeghi m kwa ihe ndia n'akwukwọ ka ewe me otú a n'ebe m'nọ: n'ihi na ọ kam nma ka m'nwua, kari ka onye ọ bula me ka ihe-inya-isim buru ihe-efu.


N'ihi na asi na emem ihe a ebe m'nāchọ ime ya, enwerem ugwọ-ọlu: ma ọ buru na emem ya mb͕e m'nāchọghi ime ya, ewerewo ntukwasi-obi nye ọchichi-èzí-na-ulo n'akam.


N'ihi na ọ bughi ayi onwe-ayi ka ayi nēkwusa, kama ọ bu Kraist Jisus, na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ayi nāsi kwa na ayi onwe-ayi bu ndi-orù-unu n'ihi Jisus.


ma-ọbu n'ichọ otuto site na madu, ma-ọbu n'aka-unu, ma-ọbu n'aka ndi ọzọ, mb͕e ayi puru idi ka ibu arọ́, dika ndi-ozi Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan