Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 9:16 - Bible Nso

16 N'ihi na asi na anam-ezisa ozi ọma, enweghi m ihe inya isi; n'ihi na nkpà nākpam; n'ihi na ahuhu dirim, asi na ezisaghi m ozi ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 9:16
21 Iomraidhean Croise  

M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.


Ma gi onwe-gi, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, bilie, gwa ha ihe nile Mu onwem nēnye gi n'iwu: atula ujọ ha, ka M'we ghara ime ka i tu ujọ n'iru ha.


I ràwom urà, Jehova, ewe ràram: I jidewom, we nwe ike karim: aghọwom ihe-ichì-ọchì ogologo ubọchi nile, madu nile ọ bula nākwam emò.


M'we si, M'gaghi-ehota Ya, m'gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n'aha-Ya. O we di n'obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n'ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike.


Ọdum ab͕ọwo uja, ọ̀ bu onye nāgaghi-atu egwu? Onye-nwe-ayi Jehova ekwuwo, ọ̀ bu onye nāgaghi-ebu amuma?


Jehova we wepum n'iso ìgwè ewu na aturu, O we sim, bú Jehova, Je, buere ndim, bú Israel, amuma.


Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ.


Ma Jisus siri ya, Ọ dighi onye ọ bula nke nēle anya n'azu, mb͕e o tiyesiri aka-ya n'ọ́gù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke.


n'ihi na ayi onwe-ayi apughi ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa.


Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:


ma bilie, ba nime obodo, agāgwa gi ihe i nāghaghi ime.


Ejim madu nile ugwọ, ma ndi-Grik ma ndi nāsu asusu ọzọ, ma ndi mara ihe ma ndi nēnweghi uche.


Ya mere enwerem inya-isim nime Kraist Jisus n'ihe nile diri Chineke.


N'ihi na asi na aguru Abraham n'onye ezi omume site n'ọlu, o nwere ihe inya isi; ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ.


N'ihi na asi na unu nwere orú nnù ndi-ozizí na nnù ndi-ozizí ise nime Kraist, ma unu enweghi ọtutu nna: n'ihi na mu onwem nime Kraist Jisus were ozi ọma mu unu.


Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n'ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n'uzọ ọ bula.


Ọbuná otú a ka Onye-nwe-ayi kara àkà ka ndi nēkwusa ozi ọma Ya si n'ozi ọma ahu di ndu.


Ma mb͕e m'biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem,


Ọzọ, sinu Akipọs, Lezie ije-ozi nke i natara nime Onye-nwe-ayi anya, ka i jezu ya.


Mu onwem kwa, ya burum ihe-árú, bú ka m'mehie megide Jehova n'igha ikpe ekpere bayere unu: ma m'gēzí unu ihe n'uzọ ahu di nma nke ziri ezi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan