Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 9:12 - Bible Nso

12 Ọ buru na ndi ọzọ eketa ike a n'ebe unu nọ, àyi onwe-ayi adighi-eketa kari? Otú ọ di, ayi ejighi ike a nara ihe; kama ayi nānagide ihe nile, ka ayi we ghara ib͕ochi ozi ọma Kraist n'uzọ ọ bula.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ọ bụrụ na ndị ọzọ kwesiri iketa uru dị otu a nʼahụ unu, ọ bụ na anyị ekwesighị iketa karịa? Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọbụla, kama anyị na-agbalịsị ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nʼoziọma Kraịst nke anyị wetara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 9:12
23 Iomraidhean Croise  

Ọ si ha, Unu eb͕ochilam, ebe Jehova meworo ka uzọm ga nke-ọma; zilagam ka m'lakuru onye-nwem.


ha we kekọta onwe-ha, ha nile n'otù, ibia ibuso Jerusalem agha, na ikpatara ya ihe-njehie.


Ahuhu gādiri unu ndi-iwu; n'ihi na unu wepuru nkpisi-ugodi nke ọmuma-ihe: unu onwe-unu abataghi, unu b͕ochi-kwa-ra ndi nābata.


n'ihi na ya na ha nālu otù ọlu-ǹkà ahu, ya na ha we nọgide, nālu kwa ọlu; n'ihi na ọlu-ǹkà-ha bu ikpa ákwà ulo-ikwū.


N'ihi nka eb͕ochi-kwa-ram ọtutu oge ndia ibiakute unu:


ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n'ihe nile.


Ezie ọ bu nọ̄ ila-ala n'ebe unu nọ ọbuná ub͕u a, na unu nwere okwu ikpé n'etiti onwe-unu. Kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emegide unu ajọ omume? kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emeb͕ue unu?


Ọbuná otú a ka Onye-nwe-ayi kara àkà ka ndi nēkwusa ozi ọma Ya si n'ozi ọma ahu di ndu.


Ma mu onwem, ejighm ihe ọ bula n'ihe ndia nara ihe: edeghi m kwa ihe ndia n'akwukwọ ka ewe me otú a n'ebe m'nọ: n'ihi na ọ kam nma ka m'nwua, kari ka onye ọ bula me ka ihe-inya-isim buru ihe-efu.


N'ihi na asi na anam-ezisa ozi ọma, enweghi m ihe inya isi; n'ihi na nkpà nākpam; n'ihi na ahuhu dirim, asi na ezisaghi m ozi ọma.


Gini kwa bu ugwọ-ọlum? Mb͕e m'nēzisa ozi ọma, ka m'we me ka ozi ọma ahu buru ihe ego nādighi nime ya, ka m'ghara ijizu ike nkem inara ihe n'ozi ọma ahu.


Ọ buru na abughm onye-ozi n'ebe ndi ọzọ nọ, ma otú ọ di, abum onye-ozi n'ebe unu nọ: n'ihi na akàrà nke ọlu onye-ozi nkem ka unu onwe-unu bu nime Onye-nwe-ayi.


Ma ihe m'nēme ka m'gēme kwa, ka m'we bipuru ndi nāchọ ihe ha gēji megidem ihe ahu ha ji megidem; ha ewe hu na ha di kwa ka ayi onwe-ayi n'ihe ha nānya isi.


N'ihi na unu nānagide ya, ma ọ buru na onye ọ bula eme ka unu buru orù, ọ buru na onye ọ bula eripia unu, ọ buru na onye ọ bula ejide unu, ọ buru na onye ọ bula eweli onwe-ya elu, ọ buru na onye ọ bula apia unu ihe n'iru.


Ma mb͕e m'biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem,


ayi adighi-eme ihe-isu-ngọngọ ọ bula n'ihe ọ bula, ka aghara ita ije-ozi-ayi uta;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan