Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 7:5 - Bible Nso

5 Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n'inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n'ihi na unu apughi ijide onwe-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 7:5
11 Iomraidhean Croise  

Ọ si ndi Israel, Nọnu na njikere nye ubọchi nke-atọ: unu abiarula nwayi nso.


Ọ buru na ọ lutara ya nwunye ọzọ; ọ gaghi-ewebì anu-oriri-ya, na ihe-nb͕okwasi-ya, na ihe kwesiri ya dika nwunye.


menu ka ndi Israel zukọta, donu nkpọkọta Israel nsọ, chikọtanu ndi-okenye, menu ka umu-ntakiri na ndi nāṅu ara zukọta: ka onye nālu nwunye ọhu si n'ime-ulo-ya puta, ka nwunye ọhu si kwa n'ulo-ndina-ya puta.


na igwa ndi-nchu-àjà ndi diri ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha okwu, ha na ndi-amuma, si, M'gākwa ákwá n'ọnwa nke-ise, nēkewaputa onwem, dika m'meworo otutu aro ra ka ndia?


Ma otú ọ di mọ di otú a apughi iputa ma-ọbughi site n'ekpere na ibu-ọnu.


Ma Ọ siri ha, Ọ bughi madu nile nānagide okwu a, kama ọ bu ndi enyeworo ya.


Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.


Ọ bughi nwunye nāchi aru nke onwe-ya, kama ọ bu di-ya: otú a kwa ọ bughi di nāchi kwa aru nke onwe-ya, kama ọ bu nwunye-ya.


N'ihi nka mu onwem kwa, mb͕e m'nāpughi idi nānagide ya ọzọ, eziterem ka m'mara okwukwe-unu, ma o nwere uzọ ọ bula onye-ọnwunwa ahu nwarari unu, ndọb͕u ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu we ghọ ihe-efu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan