Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 7:25 - Bible Nso

25 Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 7:25
15 Iomraidhean Croise  

Ọku ripiara umu-okorọbia-ha; Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.


Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.


N'ebe a ihe anāchọ kwa n'aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi.


Ma enyem ndi nọ n'ọnọdu di na nwunye iwu, ọ bughi mu onwem, kama ọ bu Onye-nwe-ayi, Ka nwunye ghara ikewapu onwe-ya n'aru di-ya


Ma ọ bu mu onwem, ọ bughi Onye-nwe-ayi, nāsi ndi fọduru: Ọ buru na nwa-nna ọ bula nwere nwunye nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwanyi ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka di-ya ghara irapu ya.


Ma asi kwa na ọ bu ezie na i luru nwunye, i mehieghi; asi kwa na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke lakuru di, o mehieghi. Otú ọ di, ndi di otú a gēnwe nkpab͕u n'anu-aru-ha: ma mu onwem nēmere unu ebere.


Akpawo kwa ókè n'etiti nwunye na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Nwanyi nke nēnweghi di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, ka o we di nsọ n'aru-ya na mọ-ya kwa: ma nwanyi nke nwere di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke uwa, otú ọ gēme ihe gātọ di-ya utọ.


Ma ngọzi dikariri ya ma asi na ọ nọgidere otú ọ di, dika ìzùm si di: ma anamechè na mu onwem nwe-kwa-ra Mọ Chineke.


Ma anamekwu nka n'uzọ nkweye, ọ bughi n'uzọ ihe enyere n'iwu.


Ihe m'nēkwu, ekwughi m dika Onye-nwe-ayi gēkwu, kama ọ bu dika n'enweghi-uche, n'ihe m'dabere we nānya isi.


N'ihi na ayi adighi ka ọra madu, ndi were ihe nādighi nma nētigwa n'okwu Chineke: kama dika ndi sitere n'idi-ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bu n'iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan