Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 7:24 - Bible Nso

24 Umu-nnam, onye ọ bula, nime ọnọdu nke akpọrọ ya, ya nọgide n'ọnọdu ahu n'ebe Chineke nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 7:24
8 Iomraidhean Croise  

Mb͕e Abram b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, Jehova mere ka Abram hu Ya anya, Ọ si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile; gi jegharia n'irum, buru kwa onye zuru okè.


Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya, ha we bà biri n'ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu. Otú a ka ọ gādi-kwa-ra ajọ ọb͕ọ a.


Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.


Ọ bu nání, dika Onye-nwe-ayi kèworo nye onye ọ bula, dika Chineke kpọworo onye ọ bula, ya jegharia otú a. Otú a ka m'nāka kwa àkà nime nzukọ Kraist nile.


Onye ọ bula, nime ọkpukpọ ahu eji kpọ ya, ya nọgide n'ọkpukpọ ahu.


Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan