Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 7:12 - Bible Nso

12 Ma ọ bu mu onwem, ọ bughi Onye-nwe-ayi, nāsi ndi fọduru: Ọ buru na nwa-nna ọ bula nwere nwunye nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwanyi ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka di-ya ghara irapu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 7:12
8 Iomraidhean Croise  

(ma asi na ọ bu ezie na ọ kewapuru onwe-ya, ya nọgide nēnweghi di; ma ọ meghi otú a, ka eme ka ya na di-ya di n'otù); ka di ghara kwa irapu nwunye-ya.


Ọzọ, nwanyi nke nwe di nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwoke ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka ọ ghara irapu di-ya.


Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.


Ékekọwo gi na nwunye? achọla ntọpu. Àtọpuwo gi n'aru nwunye? achọla nwunye.


Ma anamekwu nka n'uzọ nkweye, ọ bughi n'uzọ ihe enyere n'iwu.


Ihe m'nēkwu, ekwughi m dika Onye-nwe-ayi gēkwu, kama ọ bu dika n'enweghi-uche, n'ihe m'dabere we nānya isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan