Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 7:11 - Bible Nso

11 (ma asi na ọ bu ezie na ọ kewapuru onwe-ya, ya nọgide nēnweghi di; ma ọ meghi otú a, ka eme ka ya na di-ya di n'otù); ka di ghara kwa irapu nwunye-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 7:11
10 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.


Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n'ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, ọ nēme nwanyi ahu ka ọ nọ n'ọnọdu onye akwara iko megide: onye ọ bula nke gālu kwa ya mb͕e arapusiri ya, ọ nākwa iko.


ọ buru kwa na nwanyi onwe-ya arapu di-ya, luru kwa di ọzọ, ọ nākwa iko.


Ndi-Farisi we biakute Ya, jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya? nānwa Ya.


Nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, nke luru kwa nwanyi ọzọ, ọ nākwa iko: onye nālu nwanyi nke di-ya rapuworo nākwa kwa iko.


Ma enyem ndi nọ n'ọnọdu di na nwunye iwu, ọ bughi mu onwem, kama ọ bu Onye-nwe-ayi, Ka nwunye ghara ikewapu onwe-ya n'aru di-ya


Ma ọ bu mu onwem, ọ bughi Onye-nwe-ayi, nāsi ndi fọduru: Ọ buru na nwa-nna ọ bula nwere nwunye nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwanyi ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka di-ya ghara irapu ya.


ha gēri kwa ya nra ọgu shekel ọla-ọcha ise, nye nna nke nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o wetawo aha ọjọ n'isi nwa-ab͕ọghọ nke Israel nāmaghi nwoke: ya ka ọ gābu-kwa-ra nwunye; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan