Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 6:15 - Bible Nso

15 Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 6:15
25 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Ya burum ihe-árú ime nka: nwoke ahu achọtaworo ọkwa ahu n'aka-ya, ọnye ahu gāghọrọm orù; ma unu onwe-unu, rigo-kurunu nna-unu n'udo.


Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela.


otú a ayi, ndi di ọtutu, bu otù aru nime Kraist, buru kwa n'otù n'otù ihe di n'aru ibe-ayi.


Àyi nēsite kwa n'okwukwe-ayi me ka iwu ghara idi irè? Chineke ekwela: kama ayi nēme ka iwu guzo.


Chineke ekwela: n'ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé?


Gini kwa? ọ̀ bu na ayi gēmehie, n'ihi na ayi anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara? Chineke ekwela.


Chineke ekwela. Ayi onwe-ayi, bú ndi nwuru n'ebe nmehie di, àyi gēsi aṅa nādi ndu ọzọ nime ya?


Ya mere, èzi ihe ahu ghọrọ ọnwu n'ebe m'nọ? Chineke ekwela. kama ọ bu nmehie, ka o we puta ìhè na ọ bu nmehie, site n'iwere ezi ihe ahu lutaram ọnwu; ka nmehie we site n'ihe ahu enyere n'iwu ghọ ihe nēmehie nke-uku ri nne.


Gini ka ayi gēkwu kwa? Ìwu ahu bu nmehie? Chineke ekwela. Kama, m'gaghi-amawori nmehie, ma ọ buru na esiteghm n'aka iwu mara ya: n'ihi na m'gaghi-amatawori agu ihe ọjọ, ma ọ buru na iwu ahu asighi, Agu ihe ọjọ agula gi:


Ma anamachọ ka unu mata na Kraist bu isi nke nwoke ọ bula; nwoke bu kwa isi nke nwanyi; Chineke bu kwa isi nke Kraist.


Ma unu onwe-unu bu aru nke Kraist, buru kwa ihe di n'aru, onye ọ bula n'akuku nke ya.


Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi:


Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.


Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu;


Ùnu amataghi na ayi gēkpe ndi-mọ-ozi ikpé? àyi gēsi aṅa ghara inwe ike ikpe ihe nke ndu a?


Ma ọ buru na ahuru na ayi onwe-ayi bu kwa ndi-nmehie, mb͕e ayi nāchọ uzọ agēsi gu ayi na ndi ezi omume nime Kraist, ọ̀ bu na Kraist bu onye nēje ozi nmehie? Chineke ekwela.


Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu.


Ma Chineke ekwela ka m'nya isi, ma-ọbughi n'obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nke esiteworo na ya kpọgide uwa n'ebe m'nọ, kpọgide kwa mu onwem n'ebe uwa di.


ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo:


N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru.


n'ihi na ayi bu ihe di n'aru-Ya.


ọ dighi-ejidesi kwa Isi-ayi ike, Onye aru nile, ebe esitere na nkwonkwo-ya na akwara-ya nile nyezu ya ihe jikọ kwa ya n'otù, o sitere na Ya nāba uba nke Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan