Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 6:10 - Bible Nso

10 ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 6:10
19 Iomraidhean Croise  

Uzọ nile nke ala-mọ ka ulo-ya bu, Nāridaru ime-ulo nke ọnwu.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


Ọ̀ bu ọb͕à ndi nēme ihe-ike ka ulo a, nke akpọkwasiri aham, ghọworo n'anya-unu? Ọbuná Mu onwem, le, ahuwom ya, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma, le, akuwom ọbu-akam n'ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n'ihi ọbara-gi nke diworo n'etiti gi.


Ndi-isi-ya n'etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n'iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi.


Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe.


Mb͕e Ọ huru otù osisi fig n'uzọ, Ọ biarue ya aru, ma Ọ hughi ihe ọ bula n'elu ya, ma-ọbughi nání akwukwọ ndu; O we si ya, Ka nkpuru ghara iputa n'elu gi ọzọ ebighi-ebi. Osisi fig ahu we kpọnwua n'otù mb͕e ahu.


Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.


Unu agwọ, unu aju-ala, ùnu gēsi aṅa b͕anari ikpé nke ọku ala-mọ?


Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n'ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n'ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya.


Ub͕u a ararakwam unu nye n'aka Chineke na aka okwu amara-Ya, nke puru iwuli unu elu dika ulo, na inye unu ihe-nketa ahu n'etiti ndi nile edoworo nsọ.


Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, na anu-aru na ọbara apughi iketa ala-eze Chineke; ihe nēre uré eketaghi kwa ereghi-uré.


ma otú ọ di, edegaram unu ka unu na onye ọ bula nke anākpọ ya aha na ọ bu nwa-nna ghara imekọ ihe, ma ọ buru na onye ahu bu onye nākwa iko, ma-ọbu onye-anya-uku, ma-ọbu onye nēkpere arusi, ma-ọbu onye-nkwutọ, ma-ọbu onye nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu onye nāpunara madu ihe; ka unu na onye di otú a ghara ọbuná irikọ ihe.


ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.


Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa.


N'ihi na nka ka unu matara nke-ọma, na ọ dighi onye ọ bula nke bu onye nākwa iko, ma ọbu onye n-adighi ọcha, ma-ọbu onye-anya-ukwu, nke isi-ya bu onye nēkpere arusi, nwere ihe-nketa n'ala-eze nke Kraist na Chineke.


ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.


N'ihi na, ka onye ọ bula n'etiti unu ghara ihu ahuhu dika ob͕u-madu, ma-ọbu onye-ori, ma-ọbu onye nēme ihe ọjọ, ma-ọbu dika onye nēle ihe nābughi nke aka ya anya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan