Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 4:9 - Bible Nso

9 N'ihi na anamechè na Chineke were ayi, bú ndi-ozi, gosi, dika ndi-ikpe-azu, dika ndi amara ikpé ọnwu: n'ihi na emere ayi ihe-nkiri nye uwa na ndi-mọ-ozi na madu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 4:9
21 Iomraidhean Croise  

N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile; Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u.


Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube; Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike.


N'ìhi gini kwa ka m'siri n'afọ nnem puta ihu ọnọdu ọjọ na nwuta, ewe ji ihere me ka ubọchim nile gwusia?


Obodo ahu we juputa n'aghara ahu: ha we were otù obi nubà nime ebe anēkiri ihe, mb͕e ha jidesiri Gaiọs na Aristakọs, ndi Masedọnia, ndi nēso Pọl n'ije.


Ufọdu kwa n'etiti ndi-isi Esia, ebe ha bu ndi-eyì-ya, ha zigara ya ozi, we riọ ya ka ọ ghara inuye onwe-ya nime ebe ahu anēkiri ihe.


Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi Gi ka anēme ka ayi nwua ogologo ubọchi dum; Aguru ayi dika aturu ob͕ub͕u.


Asi na ọ bu nání na ndu a ka ayi nweworo olile-anya-ayi nime Kraist, ayi bu ndi kwesiri ebere kari madu nile.


Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.


dika ndi anāmaghi aha-ha, ma amazuru ayi; dika ndi nānwu anwu, ma le, ayi di ndu; dika ndi anēme ka ha muta ihe site n'ahuhu, ma adighi-eme ka ayi nwua;


ka ewe ghara ikwaghari onye ọ bula nime nkpab͕u ndia; n'ihi na unu onwe-unu matara na ọ bu n'ihi nka ka edoro ayi.


Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?


n'otù akuku, ebe ewere ita-uta na nkpab͕u di iche iche me unu ka unu buru ihe-nkiri; n'akuku ọzọ, ebe unu ghọrọ ndi nēso ndi nēbi obi otú a nwekọ ahuhu.


ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan