1 Ndị Kọrint 4:7 - Bible Nso7 N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya? Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 Onye gwara gị na ị pụrụ iche nʼetiti mmadụ ndị ọzọ? Ọ dị ihe ọbụla i nwere nke abụghị ihe ị natara anata? Ọ bụ gịnị ka i nwere nke ị na-anataghị anata? Ma ọ bụrụ na i natara ya, gịnị mere i ji anya isi dịka a ga-asị na ị nataghị ya anata? Faic an caibideil |
ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh: