Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 4:6 - Bible Nso

6 Ma ihe ndia, umu-nnam, ka m'mere ka ha ghọ mu onwem na Apọlos n'oyiyi n'ihi unu; ka unu we muta nime ayi ozizì a, Unu agabigala ihe edeworo n'akwukwọ, ka unu we ghara ifuli onwe-unu elu, otù onye n'ihi otù onye megide madu-ibe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ugbu a ụmụnna m ejiri m onwe m na Apọlọs mara unu atụ maka ọdịmma nke unu, ka unu nwee ike isite nʼaka anyị mụta ihe site nʼihe ahụ e dere bụ nke na-asị, “Unu agafekwala ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.” Ka onye ọbụla nʼime unu hapụ iji otu onye nyaa isi ma leda ndị ọzọ anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 4:6
35 Iomraidhean Croise  

Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha, Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.


Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya?


Rapunu madu, onye otù nku-ume di n'imi-ya: n'ihi na nìme gini ka aganāgu ya?


Ma otù onye-Ju, aha-ya bu Apọlos, onye Aleksandria n'ọmumu, nke bu onye-ọ̀kà-okwu, biaruru Efesọs; ọ di kwa ike n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ.


O we rue mb͕e Apọlos nọ na Kọrint, na Pọl, mb͕e ọ gabigasiri nime elu ala, ọ biaruru Efesọs, hu madu ufọdu ndi nēso uzọ Jisus:


N'ihi na esiterem n'amara nke enyerem si onye ọ bula nọ n'etiti unu, ka ọ ghara itukwasi uche n'onwe-ya kari nke o kwesiri itukwasi uche; kama itukwasi uche n'inwe uche zuru okè, dika Chineke kère ọtùtù nke okwukwe nye madu nile n'otù n'otù.


Ihe m'nēkwu bu nka, na unu nile n'otù n'otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist.


N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gāla amam-ihe nke ndi mara ihe n'iyì, M'gāju kwa nghọta nke ndi nwere nghọta.


ka, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi.


Ihu-n'anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n'anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n'anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu,


N'ihi na amam-ihe nke uwa nka bu ihe-nzuzu n'ebe Chineke nọ. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha:


Ya mere onye ọ bula anyala isi na madu. N'ihi na ihe nile bu nke unu;


Unu onwe-unu afuliwo kwa onwe-unu elu, unu erughi kwa újú kama nke ahu, ka ewe wepu onye ahu n'etiti unu, bú onye luru ọlu a.


Ihe-inya-isi-unu adighi nma. Ùnu amataghi na ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum?


Ma okwu bayere ihe achuru n'àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n'anya nēwuli elu dika ulo.


Ma anameme ihe nile n'ihi ozi ọma, ka m'we ghọ onye nēnwekọ ya.


N'ihi na ayi enweghi anya-ike igu onwe-ayi n'etiti ufọdu, ma-ọbu iwere onwe-ayi tule ha, bú ufọdu ndi ahu ndi ha onwe-ha nēme ka amara ha: ma ebe ha nēwere onwe-ha tù onwe-ha, were kwa onwe-ha tule onwe-ha, ha onwe-ha aghọtaghi ihe.


ayi adighi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, nke ahu bu, na ndọb͕u ndi ọzọ dọb͕uru onwe-ha n'ọlu; ma ayi nēle anya na, mb͕e okwukwe-unu nāba uba kari, agēme ka ayi di uku n'etiti unu dika ihe-ọtùtù-ayi si di rue ibabiga-ókè,


Unu nēle ihe di n'iru unu anya. Ọ buru na onye ọ bula atukwasiwo obi n'onwe-ya na ya bu onye Kraist, ya gua nka ọzọ n'onwe-ya, na, dika ya onwe-ya bu onye Kraist, otú a ka ayi onwe-ayi bu kwa.


N'ihi na asi na onye ahu nke nābia nēkwusa Jisus ọzọ, onye ayi nēkwusaghi, ma-ọbu asi na unu nānara mọ di iche, nke unu nānaraghi, ma-ọbu ozi ọma di iche, nke unu nānaraghi nke-ọma, unu nānagide ya nke-ọma.


Unu nēchè oge nile a na ayi nāgọpu onwe-ayi nye unu. Ọ bu n'iru Chineke nime Kraist ka ayi nēkwu. Ma ihe nile bu n'ihi iwuli unu elu dika ulo, ndi m'huru n'anya.


N'ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia, m'gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m'nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m'nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi;


N'ihi na asi na agamachọ inya isi, m'gaghi-abu onye nēnweghi uche; n'ihi na m'gēkwu ezi-okwu: ma esepurum aka, ka onye ọ bula we ghara igu ihe bayerem kari ihe ọ huru na abum, ma-ọbu nke ọ nuru n'ọnum.


N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke.


Unu ekwela ka onye ọ bula me ihe ọ nāchọ n'ipunara unu ihe unu nāb͕ata n'ọsọ, site n'obi di ume-ala na ikpere ndi-mọ-ozi, nēguzo n'ihe ọ huworo, onye uche nke anu-aru-ya nāfuli elu n'efu,


na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu.


N'ihi nka ka m'nwere ntachi-obi n'ihe nile n'ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan