Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Kọrint 4:2 - Bible Nso

2 N'ebe a ihe anāchọ kwa n'aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ma ihe dị mkpa bụ na o kwesiri ka ndị na-elekọta ihe ọbụla bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Kọrint 4:2
17 Iomraidhean Croise  

Ha na ndikom ahu, ndi ha nēnye ego n'aka-ha inye ndi n'eje ozi ahu, agughi ego ahu: n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obí ka ndi ahu nēme ihe.


Nání na ha na ndi ahu agughi ego nke anēnye n'aka-ha; n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka ndi ahu nēme ihe.


Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ: Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu.


Ọ bughi otú a ka orùm Moses di; n'ulom nile onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu


Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi.


Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi; i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi.


Onye-nwe-ayi we si, Ònye kwa bu onye ahu nāchi èzí-na-ulo, onye kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya gēme onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha òkè nri ha n'oge-ya?


Ka madu nāgu ayi otú a, dika ndi nējere Kraist ozi, ndi bu kwa ndi nāchi èzí-na-ulo n'ihe-omimi nke Chineke.


N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula.


Ma ọ burum ihe dikarisiri ntà ka unu, ma-ọbu ubọchi ikpé nke madu, kpem ikpé: é-è, ekpeghi m ọbuná onwem ikpé.


Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.


N'ihi na ayi adighi ka ọra madu, ndi were ihe nādighi nma nētigwa n'okwu Chineke: kama dika ndi sitere n'idi-ọcha, kama dika ndi sitere na Chineke, ọ bu n'iru Chineke, nime Kraist ka ayi nēkwu.


kama ayi juru ihe-nzuzo nile nke nēweta ihere, ayi adighi-ejeghari n'aghughọ, ayi adighi-emeso kwa okwu Chineke n'uzọ itu-ntu; kama ayi ji ngosi nke ezi-okwu nēme ka akọ-na-uche nke madu nile n'otù n'otù mara ayi n'iru Chineke.


dika unu mutara n'ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n'anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ijere Kraist ozi n'ọnọdu ayi,


Ọzọ, sinu Akipọs, Lezie ije-ozi nke i natara nime Onye-nwe-ayi anya, ka i jezu ya.


Madu nke gēme ka unu mara ihe nile bayere mu onwem bu Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, buru kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi, buru kwa orù-ibem nime Onye-nwe-ayi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan